ỤKA ASSEMBLIES ACHỤỌLA ONYEISI HA, OKOROAFỌ MAKA AKWAMIKO

Spread the love

Enugwu – Ụlọ ụka Assemblies of God achụọla Onye Nlekọta Ukwu ha, Ụkọchukwu Dọkịnta Chịdị Okoroafọ maka akwamiko.

A chụpụrụ Okoroafọ dịka ụkọchukwu maka mmekọrịta n’ezighi ezi dị n’etiti ya na otu nwanyị bi na mba Amerịka, Oriakụ Maurrissal Nwosu.

Otu nnyocha lebara anya n’okwu ahụ nke Ụkọchukwu Aịzik Mpamugo kwuru na ha chọpụtara na Okoroafọ na nwanyị ahụ nwere mmekọ megidere akwụkwọ Nsọ megidekwa iwu ụlọ ụka ahụ.

A kpọlitewokwa Ụkọchukwu Ejike Ejike dịka onye ga-abụ Onye Nlekọta Ukwu ụlọ ụka ka ọ digodu ugbua.

Kaosiladi, otu onye so n’isi n’ụlọ ụka ahụ kwuru na e nyeghị Okoroafọ ohere ọbụla ịzara ọnụ ya.

Chetakwa na o teela ụlọ ụka ahụ ji nọrọ n’ọgbaghara maka ịzọ ọkwa n’etiti Okoroafọ na Ọkammụta Pọl Emeka, onye bụbu Onye Nlekọta Ukwu ụlọ ụka ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.