ỤMAHỊ ANỌKWA? FỤLANI ASỤỌLA NDỊ EBỌNYỊ AKWỤ

Spread the love

Abakaliki – Ndi nchị ehi ndị Fụlani nọrọ ụnyahụ were wakpo ma sụọ obodo nta Ndiagu orie dị n’Ụmụogudu Akpụ nọ n’ọnụmara Ngbo nke dị n’Okpuru Ọchịchị Ọhaukwu n’Ebọnyị Steeti akwụ.

Ndị obodo ahụ na-ebokwa ndị soja Naịjiriya ebubo na aka ha dị na mwakpo a nọrọ bọọ ndị be ha ka “nama”.

A gbara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ọkụ ma bekwaa ndị ụfọdụ isi. Kaọdịugbua, ihe nwụrụ ruru mmadụ asaa.

Ihe dị mwute n’ọnọdụ a bụ na Gọvanọ Devid Ụmahị nke Ebọnyị Steeti na ndị ogbo ya na-achị Steeti ndị ọzọ na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ala anyị ka na-akpụ ụkwụ n’ala n’okwu banyere ihiwe otu nchekwa n’Ala-Igbo dịka ndị Yoroba siri jiri otu obi were hiwe otu nchekwa Amotekun.

Bikonu, ọ na nwa Mgbeke amaghị akpụ ka ọ bụ na agụba adịghị nkọ? Ọ mmadụ ole ga-anwụ tupu ndị Gọvanọ Ala-Igbo ehiwe Amotekun nke Ndigbo?

Leave a Reply

Your email address will not be published.