DINTA GBARA ONWE YA EGBE N’AMAGHỊ AMA ANWỤỌLA

Spread the love

Ọ nwụrụ maka na ndị ụlọ ọgwụ na-eche akwụkwọ ikike ndị Uwe Ojii

Asaba :Otu dinta dị iri afọ atọ n’asatọ, Mazị Ubaka Nwammọ anwụọla n’Ọgwashị Uku, Delta Steeti ụbọchị Mọnde oge mgbọ pụrụ n’egbe ya n’amaghị ama tụrụ ya.

Nwanne ya, Toni Isichei sịrị na ọ nọ n’ụlọ ọgwụ were nwụọ.

“Nwammọ gbere igbe pụta n’ụzọ were tikuo ndị mmadụ  ndị bugara ụlọ ọgwụ.

” O kwuru na ya chọrọ ikotute egbe ya n’ebe o kobere ya n’elu osisi oge mgbọ jiri gbapụ n’amaghị ama”

Isichei kọwara na dinta ahụ agaghị ịnwụ ma ọ bụghị na ndị ụlọ ọgwụ jụrụ ime ya ọgwụ ma e wetaghị akwụkwọ ikike si n’aka ndị Uwe Ojii.

Kaosiladi, ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Delta Steeti, DSP Onome Onovwakpoyeya, kwuru na ha anụghị banyere ihe ahụ

Ọ dị mwute na ụmụ amaala Naịjiriya ndị a gbara egbe ma ọ bụ ndị nwere ihe mberede okporo ụzọ ka gana etufu ndụ ha maka na ndị ụlọ ọgwụ jụrụ ileru ha anya ma e wetaghị akwụkwọ ikike n’aka ndị Uwe Ojii.

Gọọmenti Naịjiriya emebiela iwu machiburu ime onye ọbụla a gbara egbe ọgwụ n’egbughị ụzọ nweta akwụkwọ ikike ndị Uwe Ojii kemgbe afọ ole na ole gara aga.

Leave a Reply

Your email address will not be published.