ENUGWU: NDỊ GỤRỤ NA CIC EMEELA ỌZỤZỤ MAKA ỤMỤ AKWỤKWỌ NDỊ NA-APỤZỊ APỤ

Spread the love

Inwe nkwenye onwe dị oke mkpa maka mmadụ inwe agamnihu na ndụ ya- Ọkammụta Chidobem

Enugwu – Ndi gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ College of the Immaculate Conception, (CIC), Enugwu nọrọ ụnyahụ bụ Wenezdee were chịkọba ọzụzụ maka ụmụ akwụkwọ ndị nke na-apụzi apụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ.

Ọkammụta Ikechukwu Chidobem, onye jibu ọkwa dịka Onyeisi mahadum ESUT, Enugwu bụ onye mbụ nyere ụmụ akwụkwọ ahụ nkụzi.

N’okwu ya nke o kwuru n’asụsụ Igbo, Chidobem mere ka ụmụ akwụkwọ ndị ahụ na-akwado ile ule WAEC mata na “mmadụ inwe nkwenye di  oke mkpa maka mmadụ inwe agamnihu na ndụ”

Na mbụ n’okwu ya, Onyeisi Ụlọ akwụkwọ ahụ, Ụkọchukwu Chinedum Hịlarị Mgbọdile kelere otu ndị gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ ahụ maka mbọ pụrụ iche ha na-agba ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ ebe ahụ.

Ọkaiwu Dọkịnta Nwobodo Ogbu, onye jibu ọkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka Azụmahịa na Mmepụta Ngwaahịa n’Enugwu Steeti n’okwu ya nyere ụmụ akwụkwọ ahụ ndụmọdụ banyere ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi oge nile dịka etu okwu ejirimara (motto) ụlọ akwụkwọ ahụ si bụrụ Semper Fidelis nke pụtara ịkwụdosi ike (n’ihe ziri ezi) oge nile.

“Gbaanụ mbọ mezue nkwa ọbụla unu kwere. O nwere nke unu agaghị eme ụnwụ, kọwaaranụ ndị ọ bụ unu na ha n’oge.

” Ọzọkwa, unu ewekwala ego ọbụla unu akpataghị akpata. Ya bụ, zeerenu ịchụ ego n’ụdị ga-emebi ezi aha unu”

Onyeisi oche otu jikọtara ndị gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ, ngalaba nke Enugwu ma bụrụkwa onye nnọchiteanya Mpaghara Ndịda Udi n’Ụlo Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti, Rt. Hon. Chuka Bismarck Ene gwakwara ụmụ akwụkwọ ahụ okwu

“Unu kwesịrị ịhụta onwe unu ka ndị nwere isi ọma site na ịgụ n’ụlọ akwụkwọ nke zụpụtaworo ọtụtụ oke mmadụ tinyere mmadụ anọ chiworo Steeti a dịka Gọvanọ”

Ihe ọzọ pụtara ìhè e mere oge ahụ bụ na ndị gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ ahụ jiri aka ha kee nri ma bunyekwa ụmụ akwụkwọ ndị ahụ n’otu n’otu.

Omenka Ben Ngwuọcha, onye hapụrụ CIC n’afọ 1955 sokwa na ndị nwere agba bịara mmemme ahụ nke ọchịchị nọ ugbua nke otu ndị gụrụ akwụkwọ na CIC malitere.

Leave a Reply

Your email address will not be published.