LỤỌ ADA M, NWETA $10 M- TYSON

Spread the love

Maịk Tyson, nwa-afọ mba Amerịka bụbu ọkaibe n’iti ọkpọ ekwuola hoo!haa!! na nwoke ọbụla ga-alụ ada ya nwanyị ga-enweta nde dọla iri n’aka ya.

Tyson bụ onye kpara ike dị egwu oge ọ ka na-eti ọkpọ mere e ji kpọwa ya “the Baddest man”. Kaosiladi, ka o si bụrụ na ihe nile nwere mbido na-enwe njedebe, Tyson mechara bụrụ onye a kụturu ugboro ugboro.

Ada ya nwanyị a bụ Mịchel bụ nwa otu n’ime nwunye atọ ndị ọ lụrụ ma gbakwaa alụkwaghịm.

Nsogbu bụ na nwagbọghọ ahụ buru oke ibu. Ọzọkwa bụ na ụmụ okorobịa na e zeere ya maka nna ya, tupu Tyson akụpụ mmadụ eze.

Hmm, nke a bụkwa egwu onye ọ kara obi

Leave a Reply

Your email address will not be published.