E JIDELA ONYE UWE OJII DINYERE NDỊ OHI KA HA GBUO MA BURU EGO NNA YA UKWU

Spread the love

Abụja – Aka akparala otu onye Uwe Ojii n’Abụja, onye kwupụtara na ya dịnyere ndị ohi ka ha gbuo nna ya ukwu maka udiri nnukwu ego nwoke ahụ bulatara.

Sargeant Jona, onye uwe ojii bụ onye nche otu onye ọgaranya a maara dịka Emperor kọọrọ ndị Uwe Ojii ka ya na ihe siri gaa banyere ọnwụ nna ya ukwu ahụ.

“A maara m na nna m ukwu nwere ihe ruru Nde Naịra iri ise n’ụlọ.

” Ya mere jiri dinye ndị ohi ka ha bịa zuru ego ahụ”

Ọ sịkwara na ndị Oji egbe ezu ahụ gbagburu nna ya ukwu n’amaghị ama, na ebumnuche ha abụghị igbu ya egbu.

Hmm, nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara n’olu dịkwa oke njọ. Chaị!

Leave a Reply

Your email address will not be published.