LEGỌS: E MECHIELA ỤLỌ ERIMERI NDỊ CHAỊNA JỤRỤ IRESI NDỊ NAỊJIRIYA NRI

Spread the love

Legọs – Ụlọ ọrụ Federal Competition and Consumer Protection Commission (FCCPC) ụlọ erimeri ndị Chaịna dị na Victoria Island, Legọs maka ịjụ ịnabata ndị Naịjiriya ebe ahụ.

N’ozi ya na Twitter, ụlọ ọrụ FCCPC kọwara na ndị na-arụ n’ụlọ erimeri  “Haufei Restaurant and Mall” , nke dị na 33 Aboyade Close, kwuru hoo!haa!! na iwu ndị nwe ya ụlọ ọrụ machibidoro ịnabata ndị Naịjiriya ka ha rie nri ebe ahụ.

Ozi FCCPC tinyere Na Twitter kwuru sị, “Taa,  FCCPC mechiri ụlọ erimeri  Haufei Restaurant & Mall dị na 33 Aboyade Close, VI, site na àmà a gbaara anyị na ha anaghị ekwe eresi ndị Naịjiriya nri”

O kwuru na iwu ala Naịjiriya megidere udiri ajọ akparamagwa ịkpa oke ahụ.

“A ga-enyekwa ha ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị”

Hmm, bikonu, kedu ihe mmadụ ji isi kotere ndị Chinko a? Na be anyị kwa? Naịjiriya e riela nsị! Ọ kwa a sị, “Ọ bịara be onye abịagbula ya…..

Leave a Reply

Your email address will not be published.