NWA TONTO DIKE DỊ AFỌ ANỌ EWEELA IWE NA Ọ YI ÁKWÁ GBA ỌTỌ BỊA ỊHỤ YA N’ỤLỌ AKWỤKWỌ

Spread the love

Abụja – Ụfọdụ ndị bụ ihere eme. Tonto Dike, omebe ejije Nollywood okwu n’ụka na-adị mma n’ahụ emekwaala ọzọ.

Nwa ya nwoke dị afọ anọ, Andre Ọmọdayọ Churchill kparịrị ka o yi “ákwá gbọ ọtọ” gaa ileta ya n’ụlọ akwụkwọ ọtakara ya.

Tonto jiri aka kọọ ihe merenụ n’ọba ozi Instagram ya.

Ọ sịrị na obere nwa ya nwoke ahụ gbarụrụ ihu wee kwuo sị: “Nne m, ákwà a i yi adịghị mụ mma n’obi. Ọ gbagoro nnukwu”.

Tonto sị na okwu ahụ tụrụ ya n’anya mana itinye ya na Instagram gosiri na ọ bụ ihere eme, dịka o siri kwuo na mbụ.

Kaosiladi, o hichapụrụ ozi ahụ na Instagram oge ndị mmadụ bidoro kọwa ya ọnụ.

Kedụ udiri ọzụzụ Tonto ga na-enye nwa ya nwoke ebe e ji ibi ajọ ndụ mara ya?

O nweghịkwa oge a na-anụ akụkọ dị mma na ntị banyere ya.

Ndị nne na nna, kpacharanụ anya! Ụmụaka na – ahụ na-amụrụkwa ihe ọbụla unu na-eme n’ihu ha.

Ka m jụkwaa, “Nne na nna ị nọ n’ihu ụmụ esusu ọnụ  o ziri ezi?”

Leave a Reply

Your email address will not be published.