HMM, NWOKE KPỌDORO ISI N’ALA SITE N’AFỌ NNE YA ABỤRỤLA OKE MMADỤ

Spread the love

Brazil – Claudio Vieira de Oliveira, onye dị afọ iri atọ n’asaa, onye a mụrụ ọ kpọdo isi n’ala egosiwo ụwa na onye nwere ka nwere ike baa uru ma ọ bụrụ na o kweghị ka ọlụsị ya bụrụ ya ọgbata uhie.

Claudio jisiri ike tachie obi  gụruo akwụkwọ na mahadum wee bụrụ onye mgbakọ̀ ego (accountant) ma bụrụkwa onye nkà okwu (motivational speaker).

Oge a mụrụ ya, olu ya gbagọrọ agbagọ, isi kpọdo n’ala, aka ya na ụkwụ ya janwụnwuru ajanwụ.

N’ihi etu ọnọdụ ya siri dị, ndị dibịa oyibo gwara nne ya ka ọ kwụsị inye ya ara maka na ha chere na ọ gaghị adịrị.

A na-ekugharị ya n’aka ruo oge o mere afọ asatọ bụ oge ọ malitere iji ikpere aga ije.

N’ihi ya, ndị be ha mezigharịrị ala ụlọ ha ka ọ ghara ikwoba ikpere.

A rụtakwara ya àkwà ndina nakwa ngwa ụlọ ndị ọzọ pụrụ iche.

Nne ya, Oriakụ Maria Josef kwuru na ha weere Claudio ka mmadụ ibe ha, “Claudio dị ka ndị mmadụ ndị ọzọ – etu ahụ ka e siri zụọ ya”

Kaosiladi, nne ya jiri obi nne nakwa ịhụnanya were na-eleta ya n’agbanyeghị ọlụsị ya.

Taa, Claudio, onye si n’obodo Monte Carlo ya nke mba Brazil bụzị onye e ji ama atụ na mba ụwa.

Ọ na-aga mba ụwa nile aga enye nkuzi na-ebulite mmụọ ndị mmadụ.

N’agbanyeghị ọlụsị ya, o jiri onyinye Chineke nyere ya were nyere onwe ya aka.

Ọzọkwa, o bidoghi aka na o nwere ọlụsị were bụrụ onye arịrịọ. Ọtụtụ ndị ahụ dị mma na-eji maka ume ngwụ were mee onwe ha ndị ọlụsị site na iji ịrịọ arịrịọ wee mere aka ọrụ

Leave a Reply

Your email address will not be published.