ỌRỊA KORO AZỌPỤTALA NWANYỊ N’AKA NWOKE CHỌRỌ IDINA YA N’IKE

Spread the love

Lọndọn – Louisa Tọmọs, 39 bi na Farringdon, Lọndọn azọpụtala onwe ya n’aka nwoke chọrọ idina ya n’ike site na ịgwa ya na ya bu ọrịa koro (Coronavirus).

Nwanyị a sị na onye omekome ahụ kpakara ụzọ were wakpo ya n’ụlọ ya n’abalị ụnyahụ.

Ọ maghị oge nwoke ahụ ji bata maka na o dina n’oche na arahụ ụra.

“E dina m n’oche na arahụ ụra. Ihe ọzọ m hụziri bụ aka gbara agba kpuchiri m ọnụ.

” O ziri m egbe o ji ma gwa m na m tie mkpu ọ gbanye m mgbọ n’isi.

” Ọ gwakwara m na ọ ga-ahapụ m ka m yipu ákwà m ka ya mee ihe ọ bịara ime pụkwaa ozigbo.

Louisa sịrị na ya zere uzere ozigbo o wepụrụ ya aka n’ọnụ nke mere onye omekome ahụ jiri zee ma dụọ azụ.

“E zekwara m uzere ọzọ ma jiri anya mmiri gwa ya sị” Corona, e nwere ọrịa Koro. A nọ m na nzobe onwe”.

“Ọ dụkwara azụ ọzọ were jụọ m maka ncha nsacha aka”.

Louisa sị na ozigbo nwoke ahụ kwọchara aka, ọ hapụrụ ya pụọ. O mechiri ụzọ labakwa ụra.

Hmm, obodo adịghị mma bụ uru ndị Nze maka na “akọ bụ ije”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.