NWA AGBỌGHỌ CHỌPỤTARA NA ENYI YA NWOKE BỤ NWOKE JI NWANYỊ, CHỊ ỤMỤ AṄỤOLA NSI

Spread the love

Ọnịcha – Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ ka anyị nụrụ chọrọ igbu onwe ya ka ọ chọpụtara na enyi ya nwoke, ọ tụkwasịrị obi bụ nwoke ji nwanyị, chịkwa ụmụ.

Nwa agbọghọ a, Oluchi Akabilo onye Obosi dị n’okpuru ọchịchị Mgbago Ugwu Idemili nke Anambara Steeti jiri iwe were ṅụọ nsi ka o were bie ndụ ya n’ike.

Kaosiladi, a gbakwuru na ngwa, ndị Uwe Ojii were kpochie ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ,  Haruna Mohammed, kwuru na akụkọ ahụ mere eme.

O kwuru sị, “N’abalị iri n’itolu ọnwa Maachị afọ 2020, n’ebe elekere anọ nke mgbede, otu obere nwa agbọghọ, aha ya bụ Oluchi Akabilo dị iri afọ abụọ, onye bi na  Azia Striiti, Mgbuka-Obosi, ṅụrụ ọtapịa, iji were gbuo onwe ya”

“Otu nwoke, aha ya bụ Chinedu, onye ya na ya na-eme ọyị tụwara ya ime, ọ maghị na nwoke ahụ luwo nwanyị mụta ụmụ”

“Ihe kazị gbuo ya mmụọ bụ na nwoke ahụ gbahapụrụ ya were N10, 000 nye ya ka o jiri wepụ ya bụ afọ ime.

“N’ime ego ahụ ka o si zụrụ ọtapịa iji meminaa onwe ya”

Harụna kwukwara na ndị Uwe Ojii na-achọzị nwoke ahụ ka ọ bịa zara ọnụ ya.

Nwata rie ihe o jiri mụrụ anya, ụra abịa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.