IFEANYỊ JỊỌJỊ, ONYE EGWU BỌL RANGERS ANWỤỌLA N’IHE MBEREDE OKPORO ỤZỌ

Spread the love

Legọs –  Oke ọdachi dakwasịrị ndị otu egwu bọl Rangers International, Enugwu nakwa ndị nkwado ha nile n’ụtụtụ taa oge ndị egwu bọl ha mmadụ atọ nwere ihe mberede okporo ụzọ.

Ifeanyi George, onye na-agbara Rangers ihu nwụnyụrụ anya ebe a na-azọ ndụ mmadụ abụọ so ya n’ụgbọala, tinyere Ibrahim na – agbakwara Rangers bọl.

Ozi hoo!haa!! bụ na ụgbọala ha gbakpuru n’okpuru ụgbọala obu ibu (trailer).

Ifeanyi, onye dị afọ iri abụọ n’isii bụ onye so mee ka Rangers si na ịbụ ndị ikpeazụ were gbagoteruo ebe ha nọ ugbua site na ọkpụ ole o nyeere ha.

Ka mkpụrụ obi Ifeanyi Jịọji zuru ike na ndokwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.