ỌKPARA ATIKU EBUTELA ỌRỊA KORO

Spread the love

Abụja – Alahaji Atiku Abubakar, onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisiala ma bụrụkwa Onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjiriya na nhọpụta gara aga ekwuola na ọkpara ya ebutewo ọrịa a na-anyụ ụwa anya ugbua a na-akpọ ọrịa koro.

N’ozi ya n’ọba ozi mmekọrịta Twitter, Atiku rịọrọ ndị Naịjiriya ka ha tinye nwa ya ahụ, onye nke e bugaworo Ụlọ Ọgwụ Gwagwalada specialist teaching hospital maka ileru ya anya.

Atiku Abubakar gwakwara onye ọbụla kpachapụrụ onwe ya anya, na ọrịa koro abụghịkwa egwuregwu.

Chetakwa na nwunye Onyeisiala, Ayịsha Buhari nọrọ ụbọchị Tọọzdee gara aga kwuo na nwa ya nwanyị bụ Zahra, onye nke si mba Briteenụ lọta nọ na nkewapụ, iji mata ma o butewo ọrịa koro.

Kaosiladi, ọrịa koro na-egbu ma ọgaranya ma ogbenye, ma nwata ma okenye, ma ndị ọcha ma ndị isi ojii.

1

Bikonu, onye ọbụla mụrụ anya dịka azụ: ỌRỊA KORO ABATALA OBODO!

Leave a Reply

Your email address will not be published.