ỌRỊA KORO N’ENUGWU: KA E MECHIE ỤLỌ EGWU AWANTỊLỌ NAKWA ỌGBAKỌ NILE

Spread the love

Enugwu –  Ụfọdụ ndị bi n’Enugwu ekwuola ka Gọọmenti Steeti ahụ mechie ụlọ egwu awantịlọ nile nọ n’Enugwu dịka Xtreme, 2nite, Cynosure, Cubana, wdg iji belata nkesa ajọ ọrịa a na-anyụ ụwa dum anya ugbua a na-akpọ ọrịa koro.

Otu onye hoo!haa!! gbara ajụjụ ọnụ, Mazị Nnamdi Mbadiwe kwuru na nkea dị mkpa iji hụ na ọrịa ahụ akpaghị udiri mkpa mkpa ọ na-akpa na mba ndị ọzọ n’Enugwu.

“O ruwo oge a ga-emechi ụlọ egwu awantịlọ nile dị n’Enugwu maka izere ọrịa koro.

” Ihe amaghị kwuru ugbua. Ọrịa Koro lakwaa, a malitekwa ebe a kwụsịrị. Ọ bụkwanụ onye si ndụ na-agba oringo”

O kwuru ka e mechikwuo ma ahịa nakwa ebe ọbụla ìgwè mmadụ na-agbakọ tinyekwara ụlọ ahịa Shoprite ya na ebe dị iche iche a na-aga ekpori ndụ n’Enugwu dịka Bush Bar, Spices, wdg.

Ụfọdụ kwukwara na e kwesịrị ịmachi ọgbakọ ekpere nile, ọ kacha nke e nwere n’Ogige Ọkpara Square.

Hmmm, ndị mmadụ sikwara ike. A na-ekwu maka Ọrịa Koro, ụmụ akwụla achọghịdị ịma ihe a na-ekwu. Ọrụ ka na agakwa n’ihu na Spices nakwa Artisan

Leave a Reply

Your email address will not be published.