“AGBADA – NENWE GA-ENWE AGAMNIHU PỤRỤ ICHE” – MBUDE, NNUKWU ONYEISI ỌGBAKỌ NDỊ AGBADA – NENWE

Spread the love

Enugwu – Hon. Ifeanyi Mbude, Nnukwu Onyeisi Ọgbakọ obodo Agbada – Nenwe dị n’Okpuru Ọchịchị Anịnri nke Enugwu Steeti ekwuola na obodo ya ga- enwe “agamnihu pụrụ iche n’oge ọchịchị ya”.

Mbude kwuru nke a ụbọchị Fraịdee oge e duru ya na ndị otu ya n’iyi ọrụ dịka ndị isi ọgbakọ obodo Agbada – Nenwe.

N’okwu ya n’oge ahụ, Ọkaiwu Chuka Ezike, Odeakwụkwọ Nlekọta nke Mịnịstrị na-ahụ maka Mmepe Imeobodo, oge ọ na-edu ha n’iyi ọrụ dọrọ ndị ndu ọgbakọ obodo Agbada – Nenwe ahụ a họpụtara ọhụrụ ka ha hụ na ha n’Eze Ọdịnala na-achị obodo ha na-arụkọ ọrụ ọnụ iji weta udo n’agamnihu

Ichie Ben Ụzọigwe, Onowu Agbada – Nenwe, onye nọchitere anya Igwe F. N. Imo (Ezeudo Agbada – Nenwe) na Mmemme ahụ kwekwara nkwa n’aha Igwe na-achị obodo inye Mbude na ndị otu ya nkwado zuru oke.

Ndị ọbịa pụrụ iche bịara mmemme ahụ gụnyere Ichie Nwabụeze Nwobodo, onye bụbu Onye Isioche Okpuru Ọchịchị Anịnri, Ọkammụta Gọdịan Mba, Onyeisi Ngalaba okwu banyere Ụmụ Akwụkwọ na mahadum ESUT,Enugwu, Mazị Chinedu Kama, Onyeisi Ụlọ ọrụ Main Petroleum Nigeria Limited, wdg.

Mazị Chinedu Kama gwakwara Hon. Mbude, onye bụbu Odeakwụkwọ Okpuru Ọchịchị Anịnri ka o jisike n’ezi akparamagwa e ji mara ya kemgbe ọ malitere ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ijere obodo ozi.

“Ọ dị mkpa na ndị ka ji ọbara ndụ arụ ọrụ gana abụ ndị isi ọgbakọ obodo ka ha wee nwee ịghọta nke ekwe na-akụ ma nwekwaa ume ịrụ ọrụ”.

Na mmechi, Mbude nọrọ n’ụlọ erimeri Lere Garden, Orie Ẹgụ, Nenwe were lee ndị bịara mmemme ahụ ọbịa n’ụzọ pụrụ iche.

Ụbọchị ahụ, ọ dị ka ndị Anịnri e nwere ọgbakọ na Lere Garden maka na ndịsonwere Anịnri bịara n’ìgwè.

Ha gụnyere; Hon Simiọn Nwanjọkụ, Hon Israel Anị (Ngige Anịnri), Hon Ichie Chukwudi Obasi( Odoyewu), Hon. Emeka Okoro, Emeka okoro, Samuel onyeabor, Mabụza, Onye ndu Ndị Ntorobịa, PDP  Aninri, Hon. John Ogbonna Chukwu,(Ụcha), Mazị Enest Ifeanyi Ude, Onyenwe Ụlọ Akwụkwọ St Charles College, Nenwe, Ichie
Val Nwuko,( Famlaws oil & Gas), wdg.

Leave a Reply

Your email address will not be published.