ATỤỌLA JAY JAY NWANYỊ NGA MAKA YAHOO

Spread the love

Bini– Ụlọ ọrụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC ngalaba Bini nọrọ n’abalị iri abụọ n’atọ nke ọnwa Maachị afọ 2020 were hụ na a tụrụ Joan Uruvbu (Jay Jay), nwa agbọghọ na ewu ewu na mpaghara ahụ maka ịtụ akwụkwọ.

Na mkpebi ya, Ọkaikpe Emeka Nwite n’Ụlọikpe Etiti dị na Wọrị kwuru sị:

“Na gị onwe gị, Joan Uruvbu (Jay Jay), Daniel Mercedes, Paul Tommy nakwa Sally (ndị a na-achọ achọ) nọrọ site n’afọ  2018 ruo 2019 na Bini nke nọ na mpaghara ikpe ụlọikpe a were jiri ụzọ ịtụ akwụkwọ n’ọba ozi mba ụwa (internet) were napụ ndị mmadụ ego site n’ụlọ ọrụ Inland Revenue Service (IRS) nke mba Amerịka na i si na nkea were daa iwu dị na Isi  nke (27)(b) nke Iwu megidere Ịtụ Akwụkwọ.”

Kaosiladi, ebe Jay Jay kwetara na ikpe mara ya, Ọkaiwu ya, Jọn Okhihiegbe rịọrọ ụlọikpe ahụ ga e gosi ya obi ebere maka na nke a bụ mbụ a na – ama ya ikpe, na ọ bụkwa nwa agbọghọ ka nwere ọdịnihu tinyere na o gosiri mwute.

Ọkaikpe Emeka Nwite tụzịrị ya nga afọ abụọ ma ọ bụkwanụ ọ kwụọ nha otu nde Naira.

Ọ ga enyeghachikwa ndị “mugu” nile ihe ọ napụrụ ha.

Ozi si n’aka Mazị Toni Orilade bụ Onyeisi ngalaba Mgbasa ozi n’ụlọ ọrụ EFCC na-ekwu na o teela ụlọ ọrụ nchekwa nke mba Amerịka bụ FBI ji achọ Jay Jay.

Hmm, oke ọchụchọ, ma nwoke ma nwanyị. Nsogbu dịkwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.