BỊAFRA GA-ADỊ, MA EMEGHỊ NHAZIGHARỊ ỌCHỊCHỊ NAỊJIRIYA – AFENIFERE

Spread the love

Legọs – Afenifere agbaala ama na Naịjiriya ga ekewa n’oge n’adịghị anya, etu ihe siri kwuru n’obodo a taa.

Mazị Yinka Odumakin, Ode Akwụkwọ Mgbasa Ozi Afenifere kwuru nke oge ọ na-etinye ọnụ n’okwu Mazị Nnamdi Kehinde Kanu, Onyeisi otu IPOB kwuru “na a ga-enweta Biafra n’ihu ya”

Kanu nọrọ n’ozi o zisara na Rediyo Biafra were kwuo na Onye Igbo ịbụ Onyeisiala Naịjiriya agaghị isi maka na a ga-enweta Biafra oge ya onwe ya ka nọ ndụ.

Odumakin rụtụrụ aka na Naịjiriya eruwo ebe ntisa ya “aghaghịkwa” ịdị.

Ọ sịrị na Naịjiriya eruwo ọnọdụ mba Yugoslavia na USSR tupu ha etisaa.

“Ma emeghị nhazigharị ọchịchị obodo, ntisa Naịjiriya aghaghịkwa ịdị. Eee, anyị eruwo ọnọdụ Yugoslavia na USSR ruru ha ji tisaa. Ya mere  Ọbasanjo na Gọwọn ji eti mkpu na-adọ aka na ntị.

” Iwuala ọbụla n’agaghị agbanwenwu ga-agbaji agbaji”

Hmm, nkea pụtara na Buhari na ndị otu ya mere ka ọrụ ndị na-achọ Biafra nwee olileanya

Leave a Reply

Your email address will not be published.