CORONAVAỊRỌS (ỌRỊA KORO)

Spread the love

*CORONAVAỊRỌS*
*(CORONAVIRUS (COVID-19))*

*GỊNỊ BỤ CORONAVAỊRỌS?*

Coronavaịrọs bụ vaịrọs ahụrụ n’ime anụmanụ, nwere ike ị bunye mmadụ site na anụmanụ, ọ na e sikwa na mmadụ banye na mmadụ.
Coronavaịrọs nwere ike ibute ọrịa dị iche iche dịka oyi nkịtị, oké nnukwu sịndrọm akụkụ okuku ume (SARS), etiti ebe ọwụwa anyanwụ sịndrọm okuku ume (MERS). Na afọ iri abụọ na iri na itoolu (2019), Coronavaịrọs ọhụrụ pụtara na mba China.

*MGBAÀMÀ CORONAVAỊRỌS*
(1) Ahụ ọkụ ruru 100.4°F (38°C).
(2) Ụkwara.
(3) Ihe isi ike na iku ume.
(4) Ike ọgwụgwụ.
(5) Ahụ mgbu.
(6) Azụzụ.
(7) Ọrịa akpịrị.
(8) Oyi baa.

*IHE NA EBUTE ỌRỊA CORONAVAỊRỌS*
Mmadụ n’ebu ụzọ nweta coronavaịrọs site na mmekọrịta anụmanụ. Ọ nwere gbasaa site na mmadụ banye mmadụ. Ndị ọrụ ahụ ike amatabeghị anụmanụ kpatara COVID-19.
COVID-19 vaịrọs nwere ike ị gbasa site na mmekọrịta mmiri ahụ, dịka ụmụ irighiri mmiri dị n’ime ụkwara. Ọ nwere ike ịkpata site na ị metụ ihe onye nwere ya metụrụ aka wee metụ ọnụ, imi, na anya gị aka.

*NHỊKỌSỊ CORONAVAỊRỌS*
(1) Oyi baa.
(2) Ịda mbà ọgan mmadụ.
(3) Ọnwụ.

*KEDỤ KA EJI ACHỌPỤTA CORONAVAỊRỌS?*
Ị maara na ị nwere mgbaàmà nke coronavaịrọs, gawa ụlọ ọgwụ gaa hụ dọkịta gị. Dọkịta gị ga-enyocha gị, ọ ga-agwa gị ka ị nọrọ n’ime ụlọ gị naanị gị.

*ENWERE IKE IGBOCHI CORONAVAỊRỌS?*
Ee, mee ihe ndị a I ji gbochie coronavaịrọs:
(1) Zere ndị ọrịa.
(2) Zere nzukọ na ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ.
(3) Mechie ọnụ gị oge ị chọrọ ịkwa ụkwara.
(4) Sacha aka gị nke ọma oge niile.
(5) Zere imetụ aka gị na ọnụ, imi na anya gị.
(6) Zere ịnọ ndị ọrịa nso.
(7) Debe ebe ọbụla ị na emetụ aka ọcha.
(8) Nọdụ n’ụlọ ọ bụrụ na ị na arịa ọrịa ma ọ bụrụ na ị naghị eje ụlọ ọgwụ.
(9) Zere iri anụ ndụ ma ọ bụ anụ na egeghị eghe.
(10) Zere ụmụ anụmanụ.

*ỌGWỤGWỌ CORONAVAỊRỌS*
O nweghị ọgwụ mgbochi ọrịa ma ọ bụ ọgwụ ọgwụgwọ coronavaịrọs. Mgbaàmà coronavaịrọs n’eji aka ha wee laa.
Dọkịta nwere ike inye gị ọgwụ ahụ. Ňụọ nnukwu mmiri, zuo ezigbo ike.

*IHE IZE NDỤ NKE CORONAVAỊRỌS*
(1) Ị me njem gaa n’obodo ndị nwere coronavaịrọs.
(2) Mmekọrịta nso gị na onye nwere coronavaịrọs.

*SITE N’AKA:*
*DỌKỊNTA ACHỤKỌ NNAMDỊ*
*ONYE ISI NGALABA ANYA NA GENERAL HOSPITAL KAFANCHAN KADUNA STEETI*
AKARA EKWENTỊ MỤ BỤ :
*08035830985*

Leave a Reply

Your email address will not be published.