KORO EJIDELA BUHARỊ – KEMI OLUNLOYO

Spread the love

Legọs – Kemi Olunleye, nwanyị na-ekwu okwu na-ada okwu na-akọwa site n’okwu ya na Twitter na ọrịa Koro ejidela Onyeisiala Muhammadu Buharị.

 

Kemi kwuru na Buhari nọ “n’ezigbo ọrịa ma na-akwasikwa ụkwara ike”

N’ozi ya na Twitter, agaba nwanyị a kwukwara na “e sila n’ụlọ ọgwụ bubata ígwè nkutume(ventilator) iji hazie ogige nlekọta ahụike azọmndụ n’ime Asọ Rọk” iji malite ime Onyeisiala nakwa Ichie Ọchịagha Naịjiriya ọgwụ.

Chetakwa na Onyeisiala Buhari na Onowu ya, Abba Kyari, onye nke e kwuworo na o butere ọrịa Koro nọkọrịtara ọfụma kemgbe Kyari si mba Jamani, ebe o si bute ọrịa ahụ were lọta.

Hmm, ọ bụrụ eziokwu ọ bụrụ asị, ọ sọọsọ Dọkịnta Kemi Olunloyo ma.

Ekpere anyị bụ ka Chukwu ekwela ka ihe ọbụla mee Onyeisiala. Chineke hụbigara Naịjiriya n’anya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.