GỌỌMENTI AKWATUOLA ỤLỌ ELU A RUCHIRI ỤZỌ NA NEW HAVEN, ENUGWU

Spread the love

Enugwu – Ụlọ ọrụ Enugwu Capital Territory Development Authority (ECDA) akwatuola ụlọ elu dị nkwagó abụọ (2 storey) nke a rụchiri ụzọ na New Haven, Enugwu.

Ụlọ elu ahụ dị n’Okporo Ụzọ (Street) Mbanefo n’akụkụ nkwụsị ụgbọala(Bus stop) Block bụ nke karịworo iri afọ anọ e jiri rụọ ya.

Etu e siri rụchie ya n’etiti ụzọ meziri na Okporo Ụzọ Mbanefo keziri ụzọ abụọ nke na ụgbọala enweghị ike isinwuzi ebe ahụ agafe.

Gọọmenti nile chịworo Enugwu, e nweghị nke obi kara ịkụtu ụlọ ahụ bụ ọghọm dịrị ndị mmadụ.

Kaosiladi, ndị mmadụ ga-ekute ume ndụ ma e tinyekwa ụzọ ebe ahụ ụlọ ahụ dịbu maka na ọ ga-enye aka ka ụzọ dị ebe ndị bi ebe ahụ ga-esi n’agafe.

Ọzọkwa, ọ ga-ebelata mkpọchi ụzọ a na-enwewe n’ogologo ụzọ Chime Avenue site na ịbụ ụzọ ọzọ ndị mmadụ ga-esi were pụta Njegba Ụzọ Ogui (Ogui Junction) ma ha si Okporo Ụzọ Mbanefo were pụta Ụzọ Ahịa New Haven.

http://www.hoohaa.com.ng/2019/10/12/enugwu-e-mechiwo-ntachi-osa-ulo-erimeri-kacha-ewu-ewu/

Onye ikpeazụ mere udiri ihe a n’Enugwu Steeti bụ Gọvanọ Chimaroke Nnamani(Ebeanọ), oge ọchịchị ya kụturu ụlọ ndị mmadụ iji mee ka Okporo Ụzọ Chime Avenue bụrụzịa ụzọ awara awara gbara mkpị.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na nkutu ụzọ nkea tọrọ ọhaneze ụtọ.

Kaọdịtaa, e nwekwara mkpesa ụfọdụ banyere nkutu ụlọ ụlọ ọrụ ECTDA na-akụtu n’Enugwu.

Ime Ihe dị mma adịghị mfe mana ọ dị mma ileba anya na mkpesa ndị ahụ, ọ kacha ebubo na ndị ụlọ ọrụ a na-ele anya n’ihu were ahapụ ma ọ bụ akụtu ụlọ ndị mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.