ỌRỊA KORO AGBAGHỊ AKA, ANYỊ KPỤỌ ARỤ, Ọ GA-ALA – OGBONI

Spread the love

Legọs – Onyeisi otu nzuzo Ogboni confraternity, Oba Abdul Olakisan Adetoyese akọwaala ọrịa koro dịka ihe n’agbaghi aka, ma kwupụtakwa njikere ya ịchụla ọrịa ahụ site na ịkpụ arụ, iji mee ka obi dị ndị mmụọ mma.

Oba Abdul kwuru nkea ụbọchị Fraịdee site n’ozi o zigaara ndị nta akụkọ.

O kwuru sị: ” A dị m njikere ime ka obi dị ndị mmụọ mma site na ịchụ àjà n’obodo ụfọdụ dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ ala anyị iji chụlaa ọrịa a.

” Ọrịa ahụ agbaghị aka, a ga-eji usoro ime mmụọ were chụọ ya. Na mbụ, a na-eji usoro ime mmụọ achụla udiri ajọ ọrịa nfesa a ọ bụladị oge enweghị ụlọ ọgwụ ma ọ bụ sayensị

Ọ kpọkukwara ndị eze ọdịnala tinyere ndị ndu usoro okpukperechi, ma ndị Ụka, ma ndị Alakụba ka ha nile banye ekpere iji chụlaa ajọ ọrịa ji ụwa dum n’olu ugbua.

Hmmm, unu na-egekwa. Ngwanụ, ka a kpọọnụ ndị Ogboni, ndị Bishọpụ na ndị Imam ka ha banye ekpere. Onye ma nke Chukwu ga-aza

Leave a Reply

Your email address will not be published.