TỤFỊAKWA! NWOKE AGBAGBUOLA NWA YA ONYE BERE ISI NNE YA MAKA ỌGWỤ EGO

Spread the love

Nsụka – Otu nwoke bụ Mazị Siril Ugwu agbagbuola nwa ya nwoke bụ Kenet, onye gburu nne ya ma bere isi ya iji mee ọgwụ ego n’Iheaka dị n’okpuru ọchịchị Ndịda Igboeze nke Enugwu Steeti.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na Kenet, onye nọ na Legọs azụ ahịa akarangwa ụgbọala lọtara ịbịa hụ nne na nna ya.

O jiri aghụghọ rata nne ya ka ha gaa ụgbọ, ka o gbutere ya akwụ.

O gbuziri nne ya, bere isi ya donye n’akpa (polyethylene ojii) were lawa.

Ka nna ya jụrụ ya maka nne ya  ọ gwara ya na ọ nọ n’ụzọ. O jiri ọsọ gbagaa saa ahụ ka ọ laghachi Legọs ozigbo.

Nkea mere nna jiri nyowe ya enyo. Ka ya mepere akpa ahụ, ọ hụrụ isi nwunye ya (nne Kenet).

Kaosiladi, nwoke mechiri ọnụ bupute egbe nta ya, wunye ya mgbọ.

Ka Kenet kwadochara pụta, nna ya jụkwara ya maka  nne ya ọzọ mana ọ zakwara ya na ọ nọ n’ụzọ.

Kenet gwazịrị nna ya ka o kelee nne ya ma ọ lọta na ọ dị ya ọsịsọ.

Nna ya sịkwa ya jee nke ọma. Ka ọ tụgharịrị azụ ka ọ pụọ, nna ya si n’azụ gbagbuo ya.

Ka ọha obodo gbakọrọ, nwoke ziri ha isi nwunye ya n’ime akpa were kọọrọ ha ihe mere.

Ka ndị inyom nọ na-eru uju ndị nwoke bara ọhịa were bulata ozu nwanyị ahụ.

Hmm, arụ na-emekwanụ!

Leave a Reply

Your email address will not be published.