ÌGWÈ MMADỤ ETIGBUOLA NWOKE ZERE UZERE, HA CHERE BU ỌRỊA KORO

Spread the love

Ndị Uwe Ojii na mpaghara Kwale na mba Kenya na – eme  nnyocha maka ogbugbu e gburu otu nwoke zere uzere dịka onye bu ọrịa koro.

Nwoke a e gburu, Jọọjị Kotini Hezron, 35, bụ onye ụmụ ntorobịa zutere n’ụzọ ụbọchị Tuuzdee ka ọ na-ala be ya.

Uzere o zere ka onye bu ọrịa koro mere ha ji wakpo ya ma jụwa ya ihe mere o ji ekesa ọrịa ahụ.

Ha kụrụ nwoke ahụ gwoo gwoo nke mere o ji nwụọ.

Onyeisi ndị Uwe Ojii na mpaghara Kwale, Josef Nthenge kwuru na nchọpụta ha gosiri na nwoke ahụ ṅụrụ mmanya:

”Ụmụ ntorobịa ahụ gbalagara ka ndị Uwe Ojii anyị rutere nso. E bugara nwoke ahụ ụlọ ọgwụ Msambweni ebe a nọrọ kwuo na ọ nwụọlarịị.

“Kedụ ka mmadụ ga-esi maa mmadụ ibe ya ikpe ibu ọrịa koro?  Nke a bụ arụrụ ala”

Mazị Nthenge kwukwara na ndị Uwe Ojii na-ámà imi n’ala iji nwuchikọọ ndị ahụ kpara arụ ahụ.

Hmm, nsogbu ụwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.