NDOZI OBODO: “ỌNYỊBA” DỌKỊNTA LAZ UDE EZE APỤTALA N’ỌGBỌ

Spread the love

Igbo bụ Igbo, oke mmọnwụ adabatala n’ọgbọ na hoo!haa!! Ichie Dọkịnta Laz Ude Eze awuchiela n’ọba ozi hoo!haa!!

Bido taa, Ichie Laz Ude Eze gana ede edemede na NDOZI OBODO, nkewata edemede (column) na-ahụ maka ọrụ ndozi obodo (Community development) n’akwụkwọ akụkọ anyị www.hoohaa.com.ng

Ichie Eze bụ dọkịnta na – ahụ maka ahụike ọhaneze ruworo ọrụ ihe karịrị afọ iri n’abụọ na ngalaba nkwalite ọrụ ahụike.

Ihe ngabiga ọrụ ya gụnyere ịba, ịgba ọgwụ mgbochi, Atụmatụ mụọ ole ị ga-azụ, atụmatụ ahụike maka nne na nwa, otu na-ahụgasị maka ọrụ ahụike na Naịjiriya, Amerịka nakwa Togo.

O nwetara nzere mmụta MBBS dịka dibịa oyibo na Mahadum Ibadan, Naịjiriya ebe o nwetara onyinye nturuugo Medical Students’ Prize.

Ọ gụrụ akwụkwọ maka nzere mmụta dị elu na Mahadum Kentucky, Amerịka ebe o nwetara nzere mmụta dị elu nke  Masters of Public Health (MPH). O nwetara onyinye nturuugo dị iche iche na mahadum ahụ.

Ichie Eze jibu ọkwa dịka Onye Nlekọta mbụ nke ụlọ ọrụ Pink Oak Cancer Trust – Ụlọ ọrụ mbụ e hiwere na Naịjiriya maka nlekọta ọrịa cancer.

Dọkịnta Eze bụkwa Odeakwụkwọ otu National Advocates for Health – Otu jikọtara ndị Naịjiriya mmadụ iri abụọ n’isii ndị nwere àgbà ndi na-akwado Gọọmenti Naịjiriya site na ịgba mbọ n’ụzọ dị elu inweta nkwado ego maka ngalaba ahụike; o sokwa na otu ndụmọdụ pụrụ iche nke Legislative Network on Universal Health Coverage (LNUHC) ma bụrụkwa Onye Nlekọta otu West African Network of Emerging Leaders in Health Policy and Systems (WANEL) na Naịjiriya.

N’afọ 2015, akwụkwọ akụkọ Y! Naija gụnyere ya n’ime mmadụ iri na Naịjiriya bụ ndị agba ọhụrụ na Naịjiriya kacha nwee ọnụ okwu n’ihe banyere atụmatụ. Nkea bụ maka mbọ pụtara ìhè ọ gbara iji hụ na e mebere iwu ọhụrụ abụọ maka ahụike na Naịjiriya.

Ichie Eze bụ otu onye ọdịmma obodo nakwa ọganihu Ndigbo na-echu ụra.

Hmm, onye ọbụla mara Ichie Dọkịnta Laz Ude Eze maara na ọ bụ oke nwa a na-amụrụ ọha. N’Anambara a ga-akpọ ya ijele, ndị Nkanụ ga-akpọ ya Ogbuzuru ụbọshị, ndị Nenwe ga-akpọ ya Mọọ nshị mọọ.

Kaosiladi, Ichie Laz Ude Eze bụ onye Ọkpọsị. N’ihi ya, Ichie Eze bụ ỌNYỊBA.

Leave a Reply

Your email address will not be published.