COVID-19 : MKPỌCHI OBODO ERUGHI N’IME OBODO

Spread the love

Owere – Mkpọchi Obodo maka ọrịa nfesa koro (COVID-19) dị irè n’Owere bụ isi obodo Imo Steeti nke na o nweghị onye ọbụla na-agagharị site na ntimiwu Gọvanọ Steeti ahụ bụ Sinetọ Hope Ụzọdịmma iji gbochie ọrịa ahụ ifesa ebe nile.

Otu ihe ahụ ka ọ bụkwa n’Ebọnyị Steeti ebe Gọvanọ Devid Ụmahị nyekwara ntimiwu mkpọchi obodo.

N’Anambara, Gọọmenti steeti ahụ emechiela oke ala ha na Steeti ndị ọzọ nke na o nweghị onye ma ọ bụ ụgbọala nwere ike bata ma ọ bụkwanụ pụọ na Steeti ahụ.

Nke ka nke bụ na e mechiela Àkwà Mmiri Naịja bụ ọnụ ụzọ ámá ndị si mpaghara Ọdịda Anyanwụ ji abata na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ala anyị.

Enugwu Steeti nwekwara mgbochi obodo ụzọ dị mfe. Kaosiladi, mkpọchi obodo zuru oke ga – adị ire na Steeti ahụ site echi.

N’agbanyeghị nkea, nchọpụta ndị nta akụkọ anyị mere gosiri na ndị bi n’ime ime obodo esoghị eme ya bụ mkpọchi obodo.

Na Steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ala anyị, akụkọ banyere mkpọchi obodo bụrụ ha ‘akụkọ mba ofesi”.

Ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha. Ndị ahịa na-azụ ahịa ha ebe ndị ọrụ ugbo na-agakwa ugbo.

Kaosiladi, mmadụ nile na-agbazị mbọ ịsa aka ha kwa mgbe kwa mgbe. E nwekwara mmadụ ole na ole ndị yi mkpuchi ihu(face mask)

Leave a Reply

Your email address will not be published.