ỌKAIWU A NA-EBO EBUBO IKESA AKỤKỌ NA IKPEAZỤ JI ARỤSỊ NDỊ HINDU ṄỤỌ IYI NOZI NA NGA

Spread the love

Ụmụahịa – Ụlọikpe Majie nọ n’Ụmụahịa enyela iwu ka a kpọchie otu onye Ọka iwu bi n’Aba, Mazị Emperọ Gebrel Ogbonna  n’ụlọ nga Afaraukwu, Ụmụahịa.

Nkea bụ maka ebubo Aka na-achị Abịa Steeti, Dọkịnta Okezie Ikpeazụ na-ebo nwamadị ahụ, onye bụ ọka iwu na-ahụ maka ikike dịịrị mmadụ na ọ kpachara anya dee akụkọ asị n’ọba ozi megide ya.

Ndị Uwe Ojii nwụchikọrọ ya bụ ọka iwu dị iri afọ anọ n’isii n’abalị iri abụọ n’ise nke ọnwa a n’Aba ma kpụgakwa ya ụlọikpe ụbọchị ahụ.

Akwụkwọ ebubo ndị Uwe Ojii nke akara ya bụ U/194c/2020 kwuru sị:

“Na gị Emperọ Gebrel Ogbonna, nwoke, tinyere ndị ọzọ a na-achọ achọ nọrọ n’otu ụbọchị nakwa n’otu ebe were kpachara anya dee akụkọ asị ma sikwa n’ọba ozi wee zisaa ozi mmaja na Aka na-achị Abịa Steeti, Dọkịnta Okezie Ikpeazụ nọrọ n’ihu Harashima (arụsị ndị Hindu) were ṅụọ iyi idebe ntimiwu nile nke onye ọ nọchiri n’ọkwa ọchịchị nyere ya nakwa imegide ebumnuche ndị Abịa Steeti.

“Na ya (Ikpeazụ) tinyekwara aka n’akwụkwọ nke Gọvanọ chịburu Steeti ahụ, Sinetọ T. A.  Ọjị na nwa ya, Hon. Chinedum Ọjị dere na arụsị ndị ha na-efe ga-emesi ya ike ma o nupu isi na mkpebi ya na ha, bụ akụkọ ị maara dịka asị nke i dere iji bute iwe, ọnụma, mkparị, ihe ize ndụ nakwa akpọmasị megide Dọkịnta Okezie Ikpeazu wee si otu ahụ were daa iwu nke ntaramahụhụ ya dị n’okpuru usoro nke 18(1) nke iwu megidere mpụ ọbaozi nke afọ 2015.”

Ogbonna bụ Onyeisi otu Abia Coalition for Good Governance and Against Corruption, ndị mere ngagharị iwe n’Abụja nakwa Ụmụahịa were na-ekwu ka Ọnụ na – ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Abia Steeti, Hon. Chinedum Ọjị rituo n’ọkwa maka ebubo iri ngarị Ijeri Narị Narị Ise n’iri abụọ n’ise (N525billion) a na-ebo ya na nna ya, Sinetọ T. A. Ọjị.

Kọmishọna ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, Mazị Ene Okon kwuru na ọ bụ ọrụ ya ka ya na-arụ, na o nweghị izu ọbụla ya na Gọọmenti Steeti ahụ gbara banyere imesi ọka iwu ahụ ike.

Ọ kọwara na sọọsọ ihe ya mere bụ itinye aka n’akwụkwọ mkpesa nke otu onye ọka iwu si n’ụlọ ọrụ ndị ọka iwu A.C.B Agbazuere (Onowu Gọvanọ Steeti ahụ) n’Ụmụahịa nke ha gbakwunyere onyonyoo nakwa ihe akaebe ndị ọzọ dị iche iche ha ji ebo ebubo mpụ oba ozi megide Ogbonna nakwa otu onye ọzọ a na-achọ achọ.

Hmmm, na COVID-19 dị egbochighi ndị Uwe Ojii itinye nwamadị ahụ na nga.

Okwu a gbara mkpị́. N’otu aka, ebubo iri ngarị megide Sinetọ T. A.  Ọjị na nwa ya nwoke Hon. Chinedum Ọjị bụ ndị ụlọ ọrụ EFCC ka ọ dịịrị. Onye ọbụla bụ ezigbo nwa-afọ Abịa Steeti kwesịrị inwe mmasị ịhụ na e kpeziri ikpe ahụ ekpezi.

N’aka nke ọzọ, ozi wusara n’ọba ozi na Gọvanọ Ikpeazụ ji arụsị ndị Hindu ṅụọrọ Ochendo na Ikuku iyi abụghị ebubo mmadụ kwesịrị ibo mmadụ ibe ya na nkịtị maka na “mkpụtọ ọgaranya ka ogbugbu ya njọ”

Onye ọbụla kpachara anya ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.