USORO NCHEKWA KỌTỤMA: KEDU KA IGP DARA ULE MAKA NCHEKWA SI EKUZI NDỊ GỌVANỌ ALA-IGBO MAKA NCHEKWA? – CLO

Spread the love

-Igbo ga-enwelata otu nchekwa nke onwe ha

Enugwu –  Mazị Ọbọzuluike Ọfọelue, Onyeisi oche otu Civil Liberties Organization (CLO), ngalaba Enugwu Steeti ekwuola na o zighi ezi bụ etu ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ala anyị ka si na-egbu oge n’okwu banyere ihiwe otu nchekwa maka mpaghara ahụ.

N’okwu ọ gwara onye nta akụkọ anyị n’Enugwu, Mazị Ọfọelue kwuru hoo!haa na ndị Gọvanọ ahụ iji maka ọkụ Onye Nlekọta Ukwu ndị Uwe Ojii (IGP) ala anyị, Mazị Mohammed Adamu chara ha gosiri na ha ji nchekwa ndị be ha egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.

“Na ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda jụrụ ihiwe otu nchekwa nke ha gosiri na ha chọrọ iji okwu banyere nchekwa ndị be anyị were gwuo okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.

Mazị Ọfọelue kwukwara na IGP enweghị ihe o nwere ikuzi ndị Gọvanọ Ala-Igbo maka nchekwa:

“Kedụ ka onye dara Ule akwụkwọ ga-esi kuzie onye ọzọ etu ọ ga-esi gafee na ya bụ Ule nke ọ dara?

” Ọ bụrụ na ọrụ nchekwa doro ya bụ Onye Nlekọta Ukwu ndị Uwe Ojii(IGP) anya gịnị mere na o tinyeghị atụmatụ ya ndị ahụ n’ọrụ iji weta ezigbo nchekwa n’ala anyị?”

Mazị Ọfọelue kwukwara na o nweghị ihe ọhụrụ dị n’atụmatụ nchekwa Kọtụma (community policing) nke IGP wetara mere a ga-eji họrọ ya karịa inwe otu nchekwa nke ndị mpaghara ahụ dị ka ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ Ndịda siri hiwe nke ha kpọrọ Amotekun.

Kaosiladi, Gọvanọ Devid Ụmahị nke Ebọnyị, onye bụ Onyeisi oche otu jikọtara ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ekwuola na ha ga-ehiwe otu nchekwa nke ha n’ọnwa Eprel.

Leave a Reply

Your email address will not be published.