Nsụka –  Egbeigwe egbuola ụmụaka abụọ nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, ma merụkwaa mmadụ abụọ ndị ọzọ ahụ na Nsụka, Enugwu Steeti. Ụmụaka ndị ahụ nọ n’agbata afọ iri n’abụọ nakwa afọ iri n’ise bụ ndị  Ụmụnkashi dị n’Okpuru Ọchịchị Nsụka. Ụmụaka abụọ ahụ laworo mmụọ aha bụ Asogwa Nnadozie, onyeRead More →

Legọs – Òtù  ndị Amosu, Advocacy for Alleged Witches (AFAW) ji iwe na-ebuso   Apostle Johnson Suleman nke  Omega Fire Ministries, Auchi, Edo Steeti agha maka ikwu ka Gọọmenti hapụ ndị ụkọchukwu ka ha gaa n’ogige nkewapụ ọrịa koro gaa kpeere ndị ọrịa ahụ ji ekpere. AFAW adọbula ndị Naịjiriya akaRead More →

Dakar, Senegal –  Gọọmenti mba Senegal ekwuola na ọ tụọla ọgwụ ọrịa koro ọhụrụ ahụ mba Madagascar mepụtara. Abdou Latif Coulibaly, Ọnụ na-ekwuru Gọọmenti mba ahụ gwara ndị nta akụkọ na mba Senegal dị njikere ịnwale ọgwụ “ọrụ ebube” ahụ a na-akpọ Covid-Organics. Ọgwụ Covid-Organics bụ ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọRead More →

Ndị Uwe Ojii na Kenya anwuchikọọla mmadụ abụọ gbapụrụ n’ogige nkewapụ ọrịa koro ebe ha nọzị n’ọdụ nkwụ aṅụ mmanya. Ha so n’ime ọtụtụ mmadụ e setere n’onyonyoo ka ha na-awufe mgbidi otú ogige nkewapụ ọrịa koro dị na Naịrobi, Kenya. Ndị a ndị Uwe Ojii jidere kwuru na haRead More →

Ịbadan – Gọvanọ Seyi Makinde nke Ọyọ Steeti na ndị otu ya na Steeti nile dị na Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjiriya ajụla akpa osikapa nile Gọọmenti Etiti bunyere ha ụbọchị Mọnde gara aga, na ha gbara ọtị. Gọọmenti Etiti siri n’aka ụlọ ọrụ Ndị Kọstọm bunye Steeti isii nọ naRead More →

Abakaliki – Otu jikọtara ndị ndị nta akụkọ na Naịjiriya bụ Nigerian Union of Journalists (NUJ) ekwuola hoo!haa!! na ihe ọbụla mere ndị nta akụkọ n’Ebọnyị Steeti dị n’isi Gọvanọ Steeti ahụ bụ Omenka Devid Ụmahị. Nke a bụ maka Mmachi Gọvanọ Ụmahi machiri ndị nta akụkọ abụọ, Chijioke AgwụRead More →

Legọs – Njinji jiri na Legọs n’ehihie ụbọchị Mọnde n’akụkụ Shogunle na Ladipo dị Okporo ụzọ Agege na Legọs Steeti, oge aka kpaara ndị ntọrị ọ́gwụ̀ ego mmadụ isii. Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, a nwuchikọrọ ndị ntọrị ọ́gwụ̀ ego ahụ, chọrọ ịtọ̀ otu nwanyị onye na- azàcha okporo ụzọ. Kaosiladi,Read More →

Legọs –  Odogwu Nollywood,  Yul Edochie  agwala ndị mmasị ya (followers) ya n’ọbaozi mmekọrịta dị iche iche, na ọgwụ ego ya bụ sọọsọ n’onyonyoo, na Nollywood. Yul kwuru nke a maka ọtụtụ ndị na-arịọ ya ego n’ọba ozi mmekọrịta dị iche iche dịka Twitter na Instagram, kemgbe mkpọchi obodo ọrịaRead More →

Enugwu – Dọkịnta Ikechukwu Obi, Kọmishọna Enugwu Steeti na-ahụ maka Ahụike ekwuola na ezigbo nyocha na-aga n’ihu ugbua maka onye Jigawa Steeti asị na o si n’Enugwu Steeti bute ọrịa koro. Site n’ozi na-ewusa ebe nile n’obaozi ugbua, Dọkịnta Abba Umar Zakari, Kọmishọna na-ahụ maka Ahụike na Jigawa Steeti nọrọRead More →

Legọs – Ndị akwụla nọ na Naịjiriya ebeela ego na “ngwa ahịa” ha maka ọrịa koro. Ihe butere nkea bụ oke njọ ahịa nke ọrịa koro butere. N’akụkụ Naịjiriya nile, ihe amaghịkwa kwụrụ. Gọọmenti Etiti nakwa Gọọmenti steeti dị iche iche enweela mkpọchi obodo nakwa mmachibido mmekọrịta ọhaneze. Ọzọkwa bụRead More →

– O nwebeghi onye Enugwu ọbụla ketara ihe nbelata ọrịa koro – Ben Nwoye Enugwu – Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress(APC), Ngalaba Enugwu Steeti ebeela akwa arịrị maka oke agụụ dịzị n’obodo ugbua maka mkpọchi obodo ọrịa koro. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyaahụ ka e ke chara ngwaRead More →

Ibadan – Ka ọkụ na-agba n’Ahịa Dugbe, nnukwu ahịa dị n’Ibadan, Ọyọ Steeti, ụbọchị Wenezdee, ndị ekperime ji ohere ahụ na-ebukọsị ngwa ahịa ndị mmadụ. Nke kacha njọ bụ otu nwamadị ụgbọala ya gbara ọkụ n’ahịa ahụ. Ụgbọala ahụ, Toyota Matrix nwuuru ọkụ oge ndị ntinyụ ọkụ na-agba mbọ itinyụRead More →