ỌRỊA KORO: AKA AKPARALA JENIFA MAKA ỊKPỌ ORIRI NCHETA ỌMỤMỤ NA BE YA

Spread the love

Legọs – Ndị Uwe Ojii akpụrụwo Jenifa “Funke Akindele Bello, onye ọ ebe ejije na-ewu ewu maka ịkpọ oriri ncheta ọmụmụ n’ụlọ ya dị na
Ibeju-Lekki, Legọs n’agbanyeghị iwu mkpọchi obodo Gọọmenti tiri maka ọrịa koro.

Ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Legọs Steeti, Mazị Bala Elkana wepụtara kwuru sị:

” Ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii na Legọs Steeti leruru anya n’onyonyoo nke gbasara n’ọbaozi ka ụkpaka na-egosi ìgwè mmadụ nọ na mmemme ncheta ọmụmụ nke Funke Akindele Bello na di ya tinyere ndị ọzọ so emebe ihe nkiri na Naịjiriya chịkọbara n’Ibeju-Lekki, Legọs.

“Ndị Uwe Ojii si na ngalaba nnyocha ndị Uwe Ojii na Yaba gbagara ebe ahụ ma kpụrụkwa Funke Akindele Bello.

“Ime nnyocha na-aga n’ihu, ka anyị na-agbakwa mbọ ijidekwa ndị ọzọ pụtara n’onyonyoo ahụ dịka Azeez Fashola (Naira Marley) nakwa Abdul Rasheed Bello (JJC Skillz).

Ọ gwakwara ndị ahụ ka jiri aka ha bịa n’ụlọ ọrụ nnyocha ndị Uwe Ojii na Yaba n’ụbọchị Mọnde  abalị isii nke ọnwa Eprel, afọ 2020 ma ọ bụ ha abụrụzịa ndị ana achọ achọ”

Hmm,” gbara gbara fere oke, ọ bụrụ ara”. Jenifa eburula ihe nzuzu ọ na-eme n’ejije were pụta na mmadụ.

Nke a bụ “Onye ekoteghiri ọgọdọ ya, ọgọdọ ya ekotere ya”

Leave a Reply

Your email address will not be published.