ỌRỊA KORO: ANYỊ ACHỌGHỊ NDỊ DỌKỊNTA CHAỊNA, NYE ANYỊ NKWADO ZURU OKE – NMA NA-AGWA GỌỌMENTI

Spread the love

Abụja – Otu jikọtara ndị dibịa oyibo na Naịjiriya bụ Nigerian Medical Association (NMA) akatọọla atụmatụ Gọọmenti Etiti dịka Naịjiriya ji akpọbata ndị dibịa oyibo si mba Chaịna na Naịjiriya ịbịa nye aka n’agha a na-ebuso ọrịa koro.

N’ozi nke Onyeisi otu n’ala anyị, Dọkịnta Antoni Faduyile tinyere aka taa, NMA hụtara nke a dịka “anụ ụlọ atụ anya”

Ozi ahụ kwuru sị :”Otu Nigerian Medical(NMA) ji mwute anabata ozi banyere ebumnuche Gọọmenti Naịjiriya ịkpọbata ndị Dọkịnta si  Chaịna n’obodo anyị maka agha a na-ebuso ọrịa koro.

” Ọ bụ ihe ihere na e nweghị ike ime ka ndị otu anyị nakwa ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ na-agbaso mbọ ike n’agha a na-ebuso ọrịa koro mara banyere maka atụmatụ a.

” Enweghị ngwa zuru ezu, ụkọ  ákwà nchekwa ahụ nakwa ogige nnyocha ezughị ezu so na nsogbu ndị Gọọmenti kwesịrị ileba anya.

” Ọ tụzịrị anyị n’anya na ihe kazị Gọọmenti mkpa ugbua bụ ịkpọta ndị dibịa oyibo si Chaịna, ebe ndị be ha azọtabeghi onwe ha n’ọrịa ahụ

Faduyile kwuru na kata ma ịkpọta ndị foyibo ndị Chaịna ndị n’amaghị omenala nakwa usoro ahụike ndị ala anyị, na ọ ka mma ka Gọọmenti Etiti welite aka n’ego mmachi akpa a na-akwụ ndị otu ha.

O kwuru na ọ ga-eme ka mmụọ ha daa mbà ma Gọọmenti gaa n’ihu kpọọ ekwo nkụ kpọbata ndị dibịa oyibo mmadụ iri n’asatọ ahụ si mba Chaịna.

Leave a Reply

Your email address will not be published.