ỌRỊA KORO: DI NA NWUNYE EMEELA AGBAMAKWỤKWỌ N’IME ỤLỌ BE HA

Spread the love

Jalingo – Otu nwoke na nwunye ya kpebiri ịnọ n’ime ụlọ be ha were mee agbamakwụkwọ ha karịa ibugharị ya ruo mgbe ọrịa koro lara.

N’ihi ntimiwu Mkpọchi Obodo nke Gọọmenti wepụtara iji belata nfesa ajọ ọrịa koro, ọtụtụ mmadụ bugharịrị mmemme agbamakwụkwọ nakwa akwamozu ha ka ọ dịwa oge ọrịa koro jiri laa.

Kaosiladi, di na nwunye ya nọrọ n’ime be ha were mee mmemme agbamakwụkwọ iji bụzi di na nwunye site n’usoro nke ụka.

Ụnyahụ bụ Satọdee  abalị anọ nke ọnwa Eprel afọ 2020 ka ha nọrọ na be ha na Jalingo, Taraba Steeti were nara ngọzi Chineke nakwa nke nzukọ nsọ bụ ụka, n’echeweghị ka koro laa.

Iji hụ na ha dewere nnọpụ iche maka ọrịa koro, ndị ọbịa ha kpọrọ akarịghị mmadụ iri.

Sọọsọ ikwu n’ibe nakwa ndị enyi dị ha nsọ ka ha ziri.

Nkea belatara ha ego ha kaara imefu. Nke ka nke, o mere ka ha nwee ngọzi Chineke iji bie dịka di na nwunye n’emebighi iwu Chineke.

E wezụga agbamakwụkwọ ha, mmekọahụ ọbụla ha na-enwe kaara ịbụ akwamiko n’ihu Chineke.

Ya bụ, ha gbalahụrụ ọnwụnwa ọtụtụ bugharịrị agbamakwụkwọ ha ka ọ dịwa oge ọrịa koro lara ga-adabanye n’ime ya.

Hmm, uche ka e ji eso ihe ụwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.