ỌRỊA KORO: NDỊ UWE OJII, NGALABA NENWE EMEELA MGBASA MAKA ỌRỊA A

Spread the love

Enugwu – Ndị Uwe Ojii Naịjiriya, Ngalaba Nenwe emeela mgbasa ozi maka ọrịa koro.

Mgbasa ozi a ha mere ụnyahụ na taa bugara n’akụkụ dị iche iche nke obodo dị n’okpuru ngalaba ndị Uwe Ojii ahụ nke bụ Nenwe na Oduma n’Okpuru Ọchịchị Anịnri nke Enugwu Steeti.

Ndị Uwe Ojii na ndị nche ógbè jikọrọ aka ọnụ were mee ya bụ mgbasa ozi.

N’okwu ya n’oge ahụ, Onyeisi ngalaba ndị Uwe Ojii ahụ, DSP Ndụwụisi Anọsike mere ka ọhaneze mata mkpa ọ dị na onye ọbụla ga anọ n’ime be ya iji belata nfesa ajọ ọrịa ahụ.

“Ọrịa Koro enweghị ọgwụ. N’ihi ya, Gọọmenti wepụtara iwu ka onye ọbụla nọrọ n’ime ụlọ iji gbalahụ ikesa ọrịa ahụ.

” Gbaanụ mbọ were ncha na-akwọ aka unu kwa mgbe kwa mgbe. Jirinu nkachifu kpuchie unu ma unu na-akwa ụkwara. Ma unu ejighị nkachifu, werenu nku aka unu kpuchie ọnụ unu”

Ọ gwakwara ha ka ha ghara ịbịa onye ọbụla nso ma ya fọdụ ikwe n’aka ma ọ bụ ibi ọma.

Ebe ha gagasịrị n’oge ahụ gụnyere ahịa dị iche iche dịka Orie Ẹgụ Nenwe, Orie Obeẹgụ Uhueze-Nenwe, Nkwọ Amankanụ Oduma, Orie Ezinesi Oduma, Eke Ọhọfịa Oduma, wdg.

Ndị ha gwara okwu n’oge ahụ gụnyere ndị ahịa nakwa ndị na-agba ọgbatumtum mkpata ego.

Mgbasa ozi rutekwara n’Ọhọfịa Oduma, ebe ndị inyom nọ ọgbakọ.

Mazị Anọsike rịọkwara enyemaka na nkwado ọhaneze iji gaa n’ihu na mgbasa ozi ahụ nke ọ sị so n’atụmatụ ya maka ịkwalite ezi mmekọrịta n’etiti ndị ọrụ ya n’ọhaneze.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.