AGỤỤ ỌRỊA KORO: NDỊ EKPERIME EZURULA ỌTỤTỤ AKPA GARỊ

Spread the love

Yenagoa – Ndị ekperime ezuola ohi akpa garị n’ụlọ ibu (warehouse) nke ụlọ Bayelsa State Emergency Management Agency dị n’Igbogene, Yenagoa, Bayelsa Steeti.

Akpa garị ndị ohi ahụ buuru karịrị otu narị n’iri ise.

Gọọmenti steeti ahụ nọrọ ụbọchị Tọọzdee malite ikesara ndị ogbenye na Steeti ahụ ngwa nri dị iche iche dịka Ngwá Nbelata Nhịamahụ maka agụụ mkpọchi obodo nke ọrịa koro butere.

Onyeisi oche ụlọ ọrụ Bayelsa State Emergency Management Agency, Mazị Zedekaya Izu kọwara na ngwa nri ndị ahụ bụ nke e butere maka ndị ide mmiri nke afọ gara aga metụtara.

Kaosiladi, Gọvanọ Steeti ahụ, Douye Dịrị nyeziri ntụziaka ka e kesaara ndị ogbenye na Steeti ahụ ngwa nri ndị ahụ iji belata agụụ nke mkpọchi obodo ọrịa koro butere.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị ekperime ndị ahụ zuru akpa garị ndị ahụ kwuru na nke ahụ bụ oke ruuru ha site n’atụmatụ nbelata nhịamahụ nke Gọọmenti steeti ahụ.

Kaọdịtaa, ndị Uwe Ojii ejidebeghi ndị ekperime ahụ.

Hmm, nsogbu ụwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.