ỌZỌKWA! ONYE UWE OJII AGBAGBUOLA MMADỤ MAKA MKPỌCHI OBODO ỌRỊA KORO

Spread the love

Aba – Otu onye Uwe Ojii, Inspector Asu Stanley nke si na ngalaba ndị Uwe Ojii nọ n’Ohuru Isimiri, Aba agbagbuola Chibụisi Ọkameme, onye na-arụ n’ọdụ mmanụ ụgbọala (petrol station) nọ n’ụzọ Ụmụahịa n’Aba.

Njinji a jiri ụbọchị ụka, ebe elekere abụọ nke ehihie oge ndị Uwe Ojii ahụ na-achụ onye bịara ịzụrụ mmanụ ụgbọala maka ịda iwu mkpọchi obodo.

Kaosiladi, nwamadị a laworo mmụọ bụzị ihe onye uwe ojii ahụ gbatara egbe oge ọ bịara ikpe udo n’etiti ndị Uwe ojii ahụ na nwoke ahụ ha sịrị dara iwu mkpọchi obodo.

Ajọ onye uwe ojii ahụ chọrọ ịgbalaga, ma ọ bụghị na ndị uwe ojii nọ ọrụ nche ebe ahụ jidere ya.

Ha buzi nwoke ahụ gbaga n’ụlọ ọgwụ nkuzi ABSUTH, Aba, ebe ọ nọrọ were nwụọ.

Kaọdịtaa, o nweghị onye ma ihe e mere onye uwe ojii ogbu ọchụ ahụ.

Onye nta akụkọ anyị kpọrọ Ọnụ na-ekwuru Ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii n’Abịa Steeti, Mazị Giofrị Ogbonna ugboro ugboro mana ọ zaghị.

Mana ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ọ kpọrọ ya mgbapụ egbe mberede (accidental discharge).

Mazị Anọzie Inọsentị Nwokọcha, Onyeisi otu na-ahụ maka ikike dịịrị mmadụ a na-akpọ Initiative for Ideal Development and Emancipatory Leadership (Ideal Nigeria) ma bụrụkwa onye bi n’Aba katọrọ ihe ahụ onye uwe ojii ahụ mere.

“Ọrụ ndị Uwe Ojii bụ ịhụ na ọhaneze debere iwu mkpọchi obodo, ọ bụghị ịla ndụ ndị mmadụ n’iyi”.

Nwokọcha kwuru na otu ya ga-agba mbọ ịhụ na onye uwe ojii ahụ nwetara ntaramahụhụ ziri ezi.

Bikonu, ọ kwa mmadụ nwe ọgọdọ ewu na-ata. Gọọmenti a ga-agba nkịtị ka ndị ọrụ nchekwa gbuwezie ndị Naịjiriya, ndị nke ọrịa nakwa agụụ egbughi?

Leave a Reply

Your email address will not be published.