Kalaba – Òtù Biafra Nations Youth League (BNYL) ekwuola n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba afọ nile ga-abụzị ụbọchị ncheta Ọchịagha Filip Efiọng, onye bụ Osote Ọchịagha Emeka Ọdụmegwu Ojukwu dịka Onyeisiala Bịafra, ma mechaa bụrụkwa Onyeisiala Bịafra. Efiọng, ochie dike hụrụ Ndigbo nakwa ndị Biafra ndị ọzọ n’anya nke ukwuuRead More →

Legọs – Njinji jiri ụbọchị Tọọzdee n’Okporo Ụzọ Jọnsịn (Street) dị n’Alaba, Legọs, oge  Chisom Eze, dị afọ iri abụọ n’otu sụgburu nwanne ya nwoke, Henrị, dị afọ iri n’itolu ebe ha na-alụ ọgụ maka ekpem FANTA! Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na Chisom hapụrụ ekpem Fanta ahụ were pụọ iro.Read More →

Enugwu –  Òtù Igbo Renaissance Forum (IRF) agbarụọla ihu banyere etu ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ si ghara ikwu banyere ndị Ugwu Awụsa na-amịbatasi n’Ala-Igbo n’oge ugbua a machiri njem n’etiti Steeti na Steeti maka ọrịa koro. Akwụkwọ ozi IRF degaara ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Onye Nlekọta UkwuRead More →

Bauchi – Nwagbọghọ nta dị afọ iri n’asaa, Salma Hassan, asụgbuola di ya, Mohammed Mustapha, maka ịmanye ya amanye ka ha nwee mmekọahụ n’abalị agbamakwụkwọ ha. Ọ gwara ndị nta akụkọ n’isi Ụlọ ọrụ Ndị Uwe Ojii Steeti ahụ na Bauchi na ya amaghị ụma were gbuo di ya. MazịRead More →

Asaba – Okaiwu Idris Abubakar, Odeakwụkwọ Mgbasa ozi nke òtù ndị  ọkàiwu ndị Alakụba na Delta Steeti, ekwuola hoo!haa! na ntimiwu nchụpụ ahụ nke Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Oshimili nyere ndị Fulani na-achị ehi bi n’ọhịa ga-ebute  ọgbaghara ma mebikwaa ihe. N’okwu ya oge ndị Fulani bi n’ebe ahụ mereRead More →

Ọka – Sinetọ Dọkịnta Kris Nwabụeze Ngige, Mịnịsta Naịjiriya na-ahụ maka Ọrụ nọrọ na nso a were nye ndị obodo ya bụ Alọ, n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Idemili nke Anambara Steeti ngwa nbelata nhịamahụ ọrịa koro. Ngige mere nkea site n’ótù Sen. Chris Nwabueze Ngige Foundation, Alor London. Ihe o kereRead More →

Owere – Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ísí mgbaka mere Dọkịnta Tiofilọsụ Okere, onye bụbu Onye Nlekọta ụlọ mgbasa ozi Imo Broadcasting Corporation (IBC), Owere ji sụgbuo nwunye ya. Okere, onye dị afọ iri asatọ n’ise nọrọ ụnyahụ na be ya dị n’Imerienwe n’Okpuru Ọchịchị Ngor-Okpala nke ImoRead More →

Abakaliki –  Ụkọchukwu Okochi Obeni nke Ụlọ ụka God’s Descendants Assembly, Amasiri, dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Afikpo, onye ndị akpụ obi tiri gwoo gwoo ma gbakwaa ya mmiri si n’ọwa mmiri (gutter) ekwuola na ndị Dọkịnta na-ekwu na o nwere ike ịdazị ngwụrọ, ma a kpaghịrị anya. Obeni, onye bụkwaRead More →

Pakistan – Ótù onye n’ime mmadụ abụọ lanarịrịnụ na mberede ụgbọelu mere na Karachi, mba Pakistan ụbọchị Fraịdee ekwuola na ya mapụturu n’ime ụgbọelu ahụ ka ọ na-agba ọkụ. Mohammed Zubair, onye dị afọ iri abụọ  n’anọ kọwara ihe mere. “Ka ụgbọelu kụrụ, e nwetere m onwe m were hụRead More →

Enugwu –  Òtù South East COVID-19 Report, ngalaba Enugwu Steeti nọrọ ụbọchị Mọnde, abalị iri n’asatọ nke ọnwa Mee, afọ 2020 were malite atụmatụ ikesara ọhaneze mkpuchi ihu maka ọrịa koro n’efu. Ndị otu a malitere n’ahịa Arịa (New Market), ebe ha gagharịrị na-èkè ndị mmadụ mkpuchi ihu n’efu ma na-enyekwaRead More →

Abiokuta – Ndị mgbere anụ mmadụ ji iwe were tie ndị ahịa ha gwoo gwoo maka na h a akwụghị ha otu Nde Naịra ha kpebiri maka iresị ha aka mmadụ. Ha ratara ndị ahịa ha ahụ n’ime ọhịa were tie ha étí étí maka ịjụ ịkwụ ụgwọ “ngwa ahịa”Read More →

Rọshịya – Ótú onye nọọsụ “ọkụ elu” na Tula, mba Rọshịya ka ndị nlekọta Ụlọ ọgwụ Nlekọta Ọrịa Koro kwụsịrị ọrụ maka ịgba   ọtọ bịa ileta ụmụ nwoke ndị ọrịa koro. Ya bụ nwa agagbọghọ nọọsụ yi uwe nchekwa wụdara n’ala na-enyo enyo (vinyl) nke na-egosi na sọọsọ ihe oRead More →

Ọka – Ótù Ọhaneze Ndigbo, ngalaba Anambara Steeti nakwa ótù jikọtara ọgbakọ obodo nile dị n’Anambara Steeti a na-akpọ Anambra State Association of Town Unions (ASATU) ekwuola hoo!haa! na ha ga-eji aka ha were kwụsị ndị “Almajiri Agadi” ịmịbata ọzọ na Steeti ahụ. Nnukwu Onyeisi, Anambra State Association of TownRead More →

Legọs – Otu nwanyị dị iri afọ abụọ n’abụọ bụ onye Ọrịa Koro anọrọla n’ụlọ ọgwụ Lagos University Teaching Hospital (LUTH) , Idi Araba, Surulere were mụọ ejima nwoke na nwanyị. Kọmishọna Legọs Steeti na-ahụ maka Ahụike, Ọkammụta Akin Abayomi, kwuru nke a ụbọchị Tuuzdee n’ozi o zipụrụ na Twitter.Read More →

– Dọkịnta Laz Ude Eze  Igbo bụ Igbo mma mmanụ! Rienụ! Ñụọnụ! Mụọnụ! Zụọnụ! Ka ọ gaziere anyị niile ọ kachasị oge ugbua, Ọrịa Koro kwụsịrị achụmnta akụnụba n’ọtụtụ ebe na mbaụwa. Ndi bekee na-asị na “Onye agụụ jì bụ onye iwe jì”. Ndị ahụike na-ekwukwa na “onye agụụ bụRead More →

Enugwu – Aachbishọọpụ Ịmanụel Olisa Chukwuma, Onyeisi ọzụzụ atụrụ ụka Angịlịkan na Mpaghara Enugwu ekwuola na Ọrịa Koro ekpugheela ọtụtụ ndị ụkọchukwu na Naịjiriya, ndị bụ ndị amụma asị nakwa ndị nkwado na-arụ ebube adigboroja. Ụkọchukwu a okwu ya na – ada ụda kwuru nkea oge Raf Ede nke AkwụkwọRead More →