NDỊ EGOBIRI EGOBI AGBAGBUOLA ONYE OMENKA N’ENUGWU

Spread the love

Enugwu – Otu onye omenka(Engineer), Kinsli Okwudịlị Ụga ka ndị egobiri egobi gbagburu ụbọchị Tọọzdee n’Enugwu.

Ozi hoo!haa!! nwetara gosiri na ndị omekome ahụ sochiri ya azụ, ma gbawaa ụkwụ ụgbọala iji kwụsị ya oge ọ nọzị nso na be ya dị n’Okporo ụzọ Sani Abacha na Mpaghara Trans Ekulu, Enugwu n’ebe elekere asatọ nke abalị.

Ha gbazịrị ya egbe aghara aghara were gbalaga.

Nwamadị a laworo mmụọ bụ Imezi-Owa dị n’Okpuru Ọchịchị Ezeagụ n’Enugwu Steeti.

Ndị mara ya kọwara ya dịka onye tara ahụhụ were zụọ onwe ya na mahadum ESUT, Enugwu ebe ọ gụrụ na ngalaba Nkanụzụ na-arụ ụlọ nakwa ụzọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii n’Enugwu, ASP Daniel Ndukwe kwuru na nnyocha na – aga n’ihu maka ogbugbu e gburu Nwamadị ahụ onye gbara afọ iri anọ.

Kaọdịtaa, o dobeghi anya ihe kpatara ndị egobiri egobi ji were Nwamadị ahụ na-agba mbọ mmụọ n’ike.

Leave a Reply

Your email address will not be published.