“MỤ NA ÓTÚ NA-EDINA, NKE ỌZỌ A NA-EKIRI”- NWANYỊ LỤRỤ DI ABỤỌ

Spread the love

Nwanyị lụrụ di abụọ na mba Zimbabwe, Jack Chako, ekwuola na ya na di ya abụọ na-ebiko n’udo.

Nwanyị a dị afọ iri atọ kwuru na ya na ha abụọ bikọ ọnụ, na enwekọ mmekọahụ.

“Anyị na-ebi n’udo na ịhụnanya. Ọ mụ onwe m na-achị. Ọ matawo ndị di m abụọ ahụ idina n’akụkụ m abụọ n’elu àkwà.

“Mụ na ótú na-enwe mmekọahụ, onye nke ọzọ a na-ekiri.”

Ọ kọwara na e kere ọrụ èkè. Na Lifford Chimoto bụ di ya nke mbụ mana na ya lụtazịrị di nke abụọ, Michael Hwita maka na  Chimoto meziri okenye, ike adịghịkwa ya idina ya ka ahụ ya siri chọọ.

“Ha abụọ dị na mma nke ukwuu. Ume adịghịkwa Chimoto ịrụ ọrụ ya n’ahụ m dịka nwoke mana ọ na-akpata nkụ ma na-ehichakwa ụlọ.

“Hwita bụ odogwu n’elu àkwà, ọ na-eme ya ebe ọ na-adị m mma. O nwekwara anya nkà, ọ na-arụzi ma akpụkpọ ụkwụ ma ekwentị, were na ewelata ego.”

O kwukwara na ya ji ọtụmọkpọ jide ụmụ nwoke abụọ ahụ nke na o nweghị onye n’ime ha chọrọ ịhapụ ya.

” Mmadụ nile maara na m ji ọtụmọkpọ jide ha abụọ. A na m enyekwa ụmụ nwanyị ndị ọzọ, ndị di ha achọghị irubere isi ọtụmọkpọ ahụ”.

Nwanyị a mụtara ụmụ ise, nke atọ n’ime ha si n’alumdi mbụ ya na nwoke ọzọ, kwuru na ihe o ji lụta di nke abụọ bụ na ike ya na ụmụ okorobịa ndị ọzọ idina gwụzịrị ya.

Hmm, ụwa dịkwa egwu!

Leave a Reply

Your email address will not be published.