OGIGE NNYOCHA ỌRỊA KORO ANAMBARA GA-AMALITE ỌRỤ NA NSO A – ADỊNỤBA

Spread the love

Ọka – Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasa Ozi n’Anambara Steeti, Mazị  C-Don Adinuba,  ekwuola na Ogige Nnyocha Ọrịa Koro nke steeti ahụ ga-amalite ọrụ n’izu ole n’ole dị n’ihu.

Adịnụba kwuru nkea oge ndị nnọchiteanya otu South East COVID-19 Report, Ngalaba nke Anambara Steeti bịara kpọtụrụ ya ụbọchị Fraịdee, n’ogige Ụlọ ọrụ Mgbasa ozi Steeti ahụ, Anambra Broadcasting Service(ABS), Ọka, Anambara Steeti.

Adinụba gwara ndị Steeti ahụ ka ha na-ege ntị na ndụmọdụ ndị ọkachamara ọrụ ahụike dịka ndị Dọkịnta na ndị nọọsụ.

Ọ kpọkukwara ndị isi ụka dị iche iche ka ha kwado iso ụzọ sayensị were gbochie ọrịa koro.

Adịnụba kwukwara na Gọọmenti steeti ahụ atụọla ngwa nnyocha ọrịa koro nke na-eji nkeji iri n’ise eme nnyocha, n’abụghịkwa otu ụbọchị.

Na mbụ n’okwu ya, Onyeisi otu ahụ n’Anambara Steeti, Oriakụ Onyeka Obi kwuru na ha bịara njem Mkpọtụrụ na nke Kọmishọna ahụ iji nwee mkparịta ụka dị mkpa banyere ijikọ aka ọnụ were chụlaa ọrịa koro na Steeti ahụ.

Mmadụ abụọ, ndị otu ahụ,  Mazị Pius Umeh na Oriakụ Ugochi Freeman, n’okwu ha, sịrị na ọ dị mkpa na ọhaneze matara na ọrịa koro dị n’eziokwu ma mụtakwa usoro ichekwa onwe ha.

Ndị otu ahụ mechazịrị kpagharịa n’ime Ọka were mee mgbasa ozi banyere ọrịa koro ma kekwaa ndị mmadụ mkpuchi ihu

Leave a Reply

Your email address will not be published.