“ỌHANEZE KWESỊRỊ ỊNA-EYI MKPUCHI IHU(FACE MASK) ÁKWÀ, MA HAPỤRỤ NDỊ ỌRỤ AHỤIKE MKPUCHI IHU NDỊ ỤLỌ ỌGWỤ” – DỌKỊNTA OBI

Spread the love

Enugwu –  Dọkịnta Ikechukwu Obi, Kọmishọna Enugwu Steeti na-ahụ maka Ahụike ekwuola na ọhaneze kwesịrị ịna-eyi mkpuchi ihu ákwà (cloth face masks) ma hapụ mkpuchi ihu ndị ụlọ ọgwụ (surgical face masks) maka ndị ọrụ ahụike.

Dọkịnta Obi kwuru nkea ụbọchị Fraịdee, oge ndị otu South East COVID-19 Report,(SECOR), Ngalaba Enugwu Steeti bịara kpọtụrụ ya n’ụlọ ọrụ ya n’Enugwu.

“N’ihi na mkpuchi ihu ndị ụlọ ọgwụ dịzị ụkọ, ọhaneze kwesịrị ịhapụrụ ya ndị ọrụ ahụike dịka ndị dibịa oyibo na ndị nọọsụ, ma na-eyi  nke e jiri ákwà mee.

“Kemgbe m malitere ọrụ dịka Kọmishọna Ahụike, mkpuchi ihu ákwà ka m na-eyi iji mee ka ọhaneze ghọta nke a ọfụma.

“Sọọsọ oge m ji eyi mkpuchi ihu ndị ụlọ ọgwụ bụ oge m na-eleta ndị ọrịa”

Obi, onye bụkwa Ọkammụta maka Ahụike Ọhaneze kwukwara na Gọọmenti Enugwu Steeti na-emepụta nde pụrụ nde mkpuchi ihu(face masks) a ga-ekesa ọhaneze n’efu n’ime izu ụka a na Mmemme a ga-eme n’ogige Ọkpara Square, Enugwu.

O kwuru na nke ahụ bụ maka na ọ dị oke mkpa ka onye ọbụla na-eyi mkpuchi ihu oge ọbụla ha pụtara ezi. Ọ kọwakwara na ọ ka mma onye ọbụla ịnọ n’ime ụlọ be ya, iji gbalahụ ọrịa koro, oge ọbụla o nweghị ihe dị oke mkpa ha ji apụtara ezi.

SECOR bụ òtù jikọtara òtù kwụụrụ onwe ya dị iche iche nke e hiwere maka ikwado Gọọmenti steeti mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ala anyị iji chụlaa ọrịa koro na mpaghara ahụ.

Na mbụ n’okwu ya, Onye Nlekọta òtù ahụ ma bụrụkwa onye Nlekọta, òtù Centre for the Advancement of Literacy and Leadership (CALL), Mazị Ikechukwu Bismarck Ọjị, MNSE kelere Kọmishọna ahụ maka mbọ eleghị anya n’azụ ya na ndị otu ya na-agba ịchụla ọrịa koro na Steeti ahụ.

“Anyị bịara inye gị na ndị òtù gị nkwado ma marakwa ụzọ anyị si enyere unu aka n’ọrụ.

” Anyị bịara ka anyị bụrụ ụkwụ unu ga-eji gazuo ebe ndị ụkwụ unu agaghị eru maka na ọrụ unu na – arụ abụghị maka onwe unu, kama ọ bụ maka ọhaneze”

Ndị so na njem ahụ gụnyere Mazị Raf Ede, Nwa-ada Chika Mba, Mazị Kọlịns Nebo nakwa Mazị Ogene Ogbodo

Leave a Reply

Your email address will not be published.