ỤKỌ NRI MERE KA NWANYỊ SIWERE ỤMỤ YA OKWUTE

Spread the love

Ótú nwanyị ji ụmụ asatọ n’enweghị ka ọ hà ya, ejirila maka ụkọ nri so ọrịa koro mụta isiri ụmụ ya okwute na mba Kenya n’udi ka ụra buru ha ebe ha na-eche ka nri ghee.

Peninah Bahati Kitsao, bụbu onye ọsụ àkwà(laundry woman) mana ọrịa koro ekweghị ya kpatanwuo ihe ọ ga-eji elekọta ezinụlọ ya anya.

Akụkụ ebe o bi na Mombasa enweghị ọkụ  ma ọ bụ mmiri.

Ụmụ ya mechara chọpụta ihe ọ na-eme. N’okwu ya n’ụlọ mgbasa ozi mba Kenya bụ NTV, o kwuru sị: “Ma mechara gwa m na ha ma na m na-asịrị ha asị mana o nweghị ihe m nwere ike ime maka na m enweghị ihe ọbụla

Prisca Momanyi, onye agbata obi o metụtara gwazịrị ndị nta akụkọ ma mepeere nwanyị ọdọ ego n’ụlọ akụ.

Kaọdịtaa, Peninah, onye amaghị ede ma ọ bụ agụ ihe ọbụla abụrụla onye ọtụtụ mmadụ gbatara ọsọ enyemaka.

N’obi ụtọ, o kwuru sị: “Amaghị m na ndị Kenya nwere obi ebere etu a”

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.