ỌRỊA KORO: ANYỊ AHỤBEGHI URU EGO NILE A NA-AKPỌ AHA DANGOTE NA NDỊ ÒTÙ YA TỤTARA BARA NA KANO- JOHESU, KANO

Spread the love

Kano – Dọkịnta Murtala Umar, Onyeisi Oche otu jikọtara ndị ọrụ ahụike a kpọrọ Joint Healthcare Workers Union (JOHESU) ekwuola na ego nile a na-akpọ aha ya bụ sọọsọ na ntị ka ha na-anụ ya, na ha ahụbeghi uru ya.

“Ego nile anyị na-anụ, a na-akpọ ndị mmadụ na-enye, ma Dangote, ma Otedola bụ na ntị ka anyị na-anụ ha. Anyị ahụbeghi uru ya.

Umar kwuru nkea n’ụtụtụ taa n’oge ọ na-ekwu maka mkpa mkpa ọrịa koro na-akpa na Kano Steeti na Mmemme ” Sunrise Daily ” nke ụlọ Mgbasa Ozi Channels Tv.

O kwukwara na ọtụtụ ndị òtù ha na – atụzị ụjọ ịbịa ọrụ ka ha ghara ibute ọrịa koro dịka imerime ndị otu ha buteworo.

Umar kwara arịrị na Gọọmenti Etiti achọghị iji ego nile ahụ ndị mmadụ na-atụta were hụ na ndị ọrụ ahụike nwere uwe mgbochi kwesịrị ekwesị.

“A na-ahọzị ndị a na – enye uwe mgbochi ndị a ahọ maka na nke dị ezughi. Gịnị mere na Gọọmenti agaghị esi na ego nile a na-akpọ aha, ndị mmadụ tụtara were zụta uwe mgbochi ga-ezu ndị ọrụ ahụike nile?

Umar kwukwara na Gọọmenti ka ji ndị òtù ha ụgwọ ọnwa Eprel na Mee n’afọ 2018.

Nsogbu dịkwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.