“TIGBUO MMADỤ, MAỊK”, TRUMP NA-AGWA TYSON

Spread the love

Odogwu iti ọkpọ, Maịk Tyson apụtakwala n’ọgbọ ọzọ ịmalite iti ọkpọ.

Tyson, onye tiri ọkpọ ikpeazụ afọ iri n’ise gara aga kesara onyonyo ebe ọ na-eme ọzụzụ iji kwado maka Asọmmpi iti ọkpọ ọ ga-enwe na nso a iji mee achụmnta ego maka ndị ụwa na – atụ n’ọnụ.

Onyeisiala mba Amerịka, Donald Trump, ezigbo enyi Tyson egbughi oge na ịja ochie dike a ike maka etu o siri egosi na “agadi nwanyị anaghị aka nka n’egwu ọ maara agba”.

Trump dere na Twitter sị: “Tigbuo mmadụ, Maịk!”

Trump kwuru nkea maka udiri ike nakwa ọsọ odogwu a ji eti ọkpọ.

Asọmmpi iti ọkpọ Ikpeazụ Tyson nwere bụ n’afọ 2005, oge Kevin McBride kụturu ya.

Kaosiladi, nwoke a dị afọ iri ise n’atọ na-ekwu na ike ọgụ agwụbeghi ya.

“A nọ m na-eme ọzụzụ kpụ ọkụ n’ọnụ kemgbe otu izu ụka.

” Ọ bụghị obere ihe. Ahụ nile na-afụ m ka ose.

“A chọkwara m ịga kpụọ ụzụ ka m laghachikwa n’ụdị m.

” A chọrọ m ime asọmmpi iti ọkpọ maka achụmnta ego, iji nyere ụmụ anụ ọhịa dịka m, ndị n’enweghị ụlọ, jiri anwụrụ sewaa isi”

Hmm, Tyson bụ odogwu, hoo!haa!! “Dike a na – akpa ọgwụ n’anya”

Leave a Reply

Your email address will not be published.