WIKE ANAGHỊ ÁCHỊ́: NDỊ AWỤSA SO ỤGBỌ EHI ZOBATA RIVAS GA-EJE NGA

Spread the love

Pọt Haakọt – Gọvanọ Ezenwo Nyesom Wike nke Rivas Steeti ekwuola na a ga-akpụpụ ndị Awụsa e jidere n’ebe elekere iri n’abụọ nke abalị Tọọzdee ka ha na-ezobata na Steeti ahụ ụlọikpe.

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, ụmụ nwoke ndị Awụsa ndị ahụ karịrị mmadụ iri n’ise zoro onwe ha n’ime ụgbọala gwongworo bu ehi abata na Steeti ahụ.

Gọvanọ Wike kwuru na a ga – eji iwu Steeti ahụ banyere Ọrịa Koro were kpee ndị Awụsa ahụ na ndị ọzọ dara iwu mkpọchi obodo ikpe ma hụkwa na ndị ikpe mara jere nga.

O kwukwara na a ga-ere ụgbọala gwongworo ahụ bu ehi na mgbuka.

“A ga-akpụpụ ndị a dara iwu n’ihu ụlọikpe njegharị (mobile courts). A gwakwala m Ọkaiwu Ukwu Steeti a na a ga-ere ụgbọala nile e jidere na mgbuka echi bụ Fraịdee.

” Ụfọdụ ekweghị na Ọrịa Koro dị. Ma i meghị ka ha mata na anyị anaghị áchị́, ha agaghị ekweta”

Kaọdịtaa, ndị butere Ọrịa Koro na Rivas Steeti dị mmadụ iri n’anọ.

O doro anya na ndị Ugwu Awụsa kpachazịrị anya na ebubata ndị bụ ọrịa koro n’Ala-Igbo nakwa akụkụ Ọdịda Anyanwụ Naịjiriya ndị ọzọ.

Gọọmenti Enugwu, Abia nakwa Krọs Rivas Steeti ejidela ọtụtụ ndị Ugwu Awụsa na-ezobata na Steeti ndị ahụ n’agbanyeghị iwu Gọọmenti Etiti tiri nke megidere onye ọbụla ịhapụ Steeti ya banye Steeti ọzọ.

Steeti ndị a chụghachiri ndị Awụsa ndị ahụ ha jidere azụ mana Wike kwuru na ndị nkea obi kara ha batara Rivas ga ata ahụhụ, iji mee ka ndị ụmụ nwanne ha mụrụ akọ.

Ihe onye ọbụla na-ajụ bụ: Kedụ ka ndị Uwe Ojii si hapụ ndị a, ha jegide si Ugwu Awụsa gafere Enugwu, gafere Abịa were rute Rivas Steeti?

Leave a Reply

Your email address will not be published.