EMIR SANUSI NỌ “ỌMỤGWỌ” UGBUA

Spread the love

Legọs – Kemgbe a chụturu Sanusi Lamido Sanusi n’ọkwa dika Emir Kano, ihe ọma akpọọla ya ihu ugboro ugboro.

Nke mbụ, izu ụka ole na ole gara aga, o nwetara nwa nwa nke mbụ ya oge nwunye nwa ya nwoke mụtara nwa nwoke.

Nke ugbua, nwunye Sanusi nke anọ, Saddatu, onye bụkwa ada Lamido Adamawa mụtara ya nwa nwanyị.

Ihe ịtụnanya bụ udiri ezi mmekọrịta dị n’ime ezinụlọ Sanusi. Ma nwunye anọ, ma ụmụ ya iri n’abụọ, ha nile na-ebi ka ndị otu nne ji.

Ashraf, nwa nwoke Muhammad Sanusi bụ onye nọrọ n’Instagram were gwa ụwa na nna ya nọ “ọmụgwọ” ugbua.

O kwuru na ọ bụ nwunye nke abụọ rịọrọ nna ha ka ọ gụọ nwa ọhụrụ ahụ, Saadiyya, bụ aha nwunye nke mbụ, onye lekọtara ya anya oge ọ dị ime.

O kwuru sị:, “Oge ọbụla a jụrụ m maka nne m, a na m’ ekwu na m nwere nne atọ (dịzị anọ ugbua) maka na ndị nwunye nna m nile bụcha nne m.”

Hmm, nke a bụ nnukwu ihe mmụta dịịrị ọtụtụ ezinụlọ otu nne ji, n’ebighi n’udo.

Ọrụ iweta udo n’ezinụlọ dịịrị ndị nne na nna. Aka unu ji zụọ ụmụ unu ka ha ga-eji tolite.

Leave a Reply

Your email address will not be published.