ODUMEJE GA-EJE NGA, MAKA ỊZỌ NAIRA ỤKWỤ – HURIWA

Spread the love

Ọnịcha – Odumeje, onye amụma Chukwuemeka Ọhanyere nọ n’ezigbo nsogbu ugbua.

Otu Human Rights Writer (HURIWA) edegarala Ụlọ akụ Etiti Naịjiriya (CBN) akwụkwọ mkpesa megide Odumeje maka etu o si azọ Naira bụ ego mba Naịjiriya ụkwụ, ebe a na-abọ ya ego n’ụlọ ụka ya.

HURIWA kwuru na nkea megidere iwu Naịjiriya ma kpọkukwaa CBN ka ha hụ na Odumeje nwetara ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị.

Etu o si dị n’iwu, ntaramahụhụ maka ịkparị Naira, bụ ego mba Naịjiriya bụ nga ọnwa isii, ma ọ bụ nha N50,000 ma ọ bụkwanụ ije nga ma kwụkwaa nha ahụ.

Chetakwa na okwu a dapụtara ugbua ụmụ Pericomo Okoye, odogwu laworo mmụọ, nwoke Arọndizuọgụ eji ime mmọnwụ nakwa ime àmànsì were mara na-ebuso Odumeje agha maka ịkparị nna ha nakwa ịkọcha ndị Arọndizuọgụ.

Kaosiladi, Mazị Dozie Ịma Ọnwụbiko, Onyeisi, otu HURIWA bụkwa onye Arọndizuọgụ.

Ọ dịkwa mma, ọ bụrụ na a ga-amalite ijide ndị nile dara iwu Naira ka e jidewe ndị nile ka na-abọ ego na mmemme maka na ha nile na – ada iwu.

Hmm, bikonu, ndị Izuọgụ hapụrụnụ anyị Odumeje (Oduhaeje), onye na-akpa anyị obi ụtọ anyị ji edi nsogbu Ọrịa Koro.

Ndị Izuọgụ, bikonu, rịọnụ ndị be Pericomo ka ha were ya ka egwu. Anyị hụrụ onyonyoo ebe ha tụrụ Odumeje n’arụsị. O rubeghi udi ahụ.

Gbagharanụ ya, ọ maghị ụma. Ndị ma odogwu Odumeje nyekwa ya ndụmọdụ. O nwere ndị amaghị ama njakịrị

Leave a Reply

Your email address will not be published.