OSINBAJỌ BỤ ONYEISI OCHE, ÒTÙ NDỊ MKPỤMKPỤ NA NAỊJIRIYA – EL RUFAI

Spread the love

Kaduna – Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna Steeti ekwuola na Osote Onyeisiala Naịjiriya, Ọkammụta Yemi Osinbajo bụ Onyeisi Oche, òtù ndị Mkpụmkpụ na Naịjiriya.

O kwukwara sị, “N’ihi ya, anyị bụ ndị mkpụ mkpụ so n’isi ọchịchị obodo a”

El-Rufai kwuru nkea na njakịrị, ka ọ na-azaghachi onye njakịrị bụ Olateju Oyelakin, onye nke e ji Teju Babyface were mara maka ozi o tinyere na Twitter.

Teju Babyface tinyere onyonyoo ajụjụ ọnụ ọ gbara El Rufai afọ iri gara aga, ebe ha na-ekwu maka ndị mkpụmkpụ. Babyface n’onwe ya etoghikwa ogo.

N’ịgba ajụjụ ọnụ ahụ, Babyface jụrụ El Rufai ma o nwere mgbe ịbụ onye mkpụmkpụ ji eche ya uche.

El Rufai zaghachiri, “Oge m dị na nwata nakwa oge m na-etolite, ọ na-eche m echiche, maka na ọmalincha ụmụ agbọghọ nile ihe na-amasị m kacha m ogo. E mechara tofee nke ahụ.

E jisikwara m ike hụ nwanyị mara mma onye jitu obere ihe kara m mkpụmkpụ”

Bikonu, Osinbajọ, El Rufai, Ngige na Oshiomole, kedu onye ka ogo?

Leave a Reply

Your email address will not be published.