OPC AGỤNYELA NDỊ ỌRỊA KORO SI KWARA NA KOGI NA NDỊ GA-EKETA N3M MAKA NRI

Spread the love

Legọs – Otu Oodua Peoples Congress(OPC) nọrọ ụbọchị Wenezdee na Legọs were nye Nde Naira atọ ka ndị ọrịa koro na Steeti isii nke Mpaghara Ọdịda Anyanwụ tinyere Kwara na Kogi wee zụrụ nri na ihe ndị ọzọ.

Aare Onakakanfo nke Ala Yoroba, Iba Gani Abiodun Ige Adams, onye bụkwa Onye Nlekọta Ukwu, otu OPC, kwuru na nke ahụ bụ iji nyere Gọọmenti aka were hụ na ndị ọrịa ahụ nile nwetara ezi nleru anya n’ogige  nlekọta ọrịa koro dị iche iche ha nọgasị na Steeti ndị ahụ.

Adams nyekwara Gọọmenti ndụmọdụ ka lebaa anya na iji ụzọ ọgwụ omenala were gwọọ ọrịa ahụ dịka ndị Madagascar siri mee.

Aare Ona Kakanfo kọwara na ha enyebuola Nde Naira ise n’agba nke mbụ nke Nbelata ihe nhịamahụ ha nyere ndị ọrịa koro bụ ndị be ha.

Hmm, “Ụzụ amaghị akpụ ogele, lee egbe anya nọdụ”. Ndị IPOB, MASSOB, BIM na ndị otu Biafra ndị ọzọ uche unu dị ya.

Ndigbo, e mee elu, e mee ala, ka anyị na-echeta ụmụnne anyị ndị Delta na Rivas Steeti na ihe nile.

Leave a Reply

Your email address will not be published.