ỌRỊA KORO EGBUOLA NWANYỊ AMERỊKA BỊARA ỊHỤ IKO YA NA WỌRỊ

Spread the love

Wọrị – Nwanyị onye ọcha, onye Amerịka dị iri afọ isii n’asaa bịara ịhụ iko ya onye nwa Naịjiriya anwụọla n’Ọrịa Koro ụbọchị ụka n’ụlọ ọgwụ na Delta Steeti.

Ozi hoo!haa!! nwetara gosiri na nwanyị ahụ na iko ya nọ n’ụlọ nkwari akụ n’Osubi, Orerokpe dị n’Okpuru Ọchịchị Okpe kemgbe abalị atọ nke ọnwa Maachị, afọ 2020, o jiri bata Naịjiriya.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Delta Steeti, DSP Onome Onovwakpoyeya, tinyere ọnụ n’okwu ahụ.

“Nwokorọbịa ahụ na nwanyị Amerịka ahụ nọrọ izu ụka ole n’ole n’ụlọ nkwari akụ n’Osubi.

” O bugara nwanyị onye ọcha ahụ ụlọ ọgwụ ka ọ malitere igosipụta ejirimara ọrịa koro dịka oke ụkwara ebe ọ nọrọ were nwụọ n’ụbọchị ụka”

Iko ya jizi ụgbọala Toyota Venza were buga ozu ya n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii n’Orerokpe ebe ndị Uwe Ojii nọrọ kpọchie ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.