A NWUCHIKỌỌLA ỤMỤ NWANNE NWANYỊ ABỤỌ NDỊ MBA NIGER NDỊ ONYEISI NDỊ EKPERIME ZAMFARA NA-EDINAKỌ

Spread the love

‌Gusau –  Ndị ụlọ ọrụ nchekwa Civil Defence anwuchikọla ụmụnne nwanyị abụọ ndị mba Niger, ndị Onyeisi ndị Ekperime Zamfara na-edinakọ.

E jidere Binta Husaini na Balki Husaini, ndị si Konni dị na mba Niger ụbọchị Tọọzdee ka ọgbatumtum bu ha na – abanye n’ime oké ọhịa Bagega n’Okpuru Ọchịchị Anka nke Zamfara Steeti, ebe Shaho, Onyeisi ndị ekperime na-emenye ndị Steeti ahụ egwu ji mere ọnọdụ ya.

Ụmụ agbọghọ ndị a sị na ha batara Naịjiriya kemgbe afọ gara aga kwuru na ekperime ahụ na – akwụ ha puku Naira Isii oge ọbụla ha na ya nwere mmekọahụ.

“Anyị bi na Sabon Gari  Kaura Namoda. Ha na-akwụ anyị puku Naira Isii oge ọbụla anyị na ha dinara.

Anyị na ha edinawo ihe ruru ugboro anọ. Ọ na-abụ anyị rute Anka, anyị echere onye ọgbatumtum ha ga-ezite ka ọ bịa buru anyị”

O doro anya na ụmụ agbọghọ a na-agba akwụla batara Naịjiriya n’ejighi akwụkwọ ikike ọbụla.

Leave a Reply

Your email address will not be published.