A TỌHAPỤLA STRIKER, NNAMDI OBI, NWA IPOB NỌ NGA KEMGBE ỌNWA ISII

Spread the love

 

Ụmụahịa – Ụlọikpe nọ n’Ụzọakọlị, Abia Steeti nọrọ ụbọchị Tọọzdee were tọhapụ Striker, Nnamdi Obi, onye nọ n’ụlọ nga kemgbe ọnwa isii.

Ndị Uwe Ojii jidere ya na ndị otu ya mmadụ abụọ ndị ọzọ n’abalị asatọ nke ọnwa Disemba, afọ 2019 n’ụzọ MCC, n’aha, Abia Steeti maka ịbụ ndị IPOB nakwa iji ọkọrọtọ Biafra n’ụgbọala ha.

Kaosiladi, a tọhapụrụ ndị otu ya n’ime ọnwa Disemba ahụ mana a hapụrụ ya onwe ya n’ụlọ nga dị n’Afara.

N’ihi etu Striker si bụrụ onye na-ewu ewu nakwa onye na-emesi ihe ike n’ọgbakọ IPOB n’Aba, ndị otu ya mere ngagharị iwe n’ọnwa gara aga maka nga a hapụrụ ya n’ime ya  n’ewepụghị okwu ya ụlọikpe.

Striker, Nwannaa nnọọ,  ugbua abụghịzi oge ịchị ọkọrọtọ  Biafra agbagharị. Kama ihe a bụ oge agha iche, oge “iji uche kụọ ọkpa…”

Leave a Reply

Your email address will not be published.